You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọ bụ eziokwu na ọnụ ahịa ihe oriri dị icheiche agbadatala?
Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ akụnaụba obodo bụ nke akpọrọ National Bureau of Statistics (NBS) n'asụsụ Bekee depụtara n'akwụkwọ na ọnụ ahịa ejiri la pesent 0.86 gbadata.
Ọnụọgụgụ a bụ nke ọnwa eprelu bụ ugboro iri na ise ọnụọgụgụ a na-ada kemgbe ebidoro ị gụ ọnụọgụgụ a.
E kwụkwara na ọnụ ahịa nke ime obodo bụ nke bekee kpọrọ "rụral inflation" siri na pesent 12.99 rida na pesent 12.13 n'ọnwa eprelu kwa.
Otu onye na-azụ ahịa na ahịa Oyingbo na Legọs bụ Grace Ogbonna gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ọnụ ahịa a emetụtaghị nrị ndị ha na-ere ere n'ahịa.
Oriakụ Ogbonna kwuru na nrị dịka osikapa, agwa, garri na mmanụ nrị tinyechara ego ma enyocha ya kemgbe afọ gara aga.
Gee ihe Grace Ogbonna gwara BBC Igbo n'uju
Akụkọ ga-amasị gị: