APGA Primaries: Soludo emeriela na ntuliaka imeụlọ otu APGA

Ọkammụta Charles Soludo emeriela na ntuliaka imeụlọ otu APGA mere maka ọkwa gọvanọ Anambara steeti aga eme n'ọnwa Novemba afọ 2021.

Soludo , onye bụbụ onyeisi ụlọakụ etiti ji vootu dị 740 n'ime 792 mere Ichie Ezenwankwo bụ onye nwetara vootu 41 na ntuliaka ahụ e mere n'Ọka ụbọchị Wednezde.

Ndị ọzọ so zọọ ntuliaka imeụlọ ahụ bụ Damian Okolo nwetara vootu asaa, ebe Thankgod Ibeh nwetara vootu anọ.

Awka na-ekpobu ọkụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde dịka ntụliaka imeụlọ nke otu APGA na-aga n'ihu n'ọgbọ egwuregwu Alex Ekwueme.

Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ọ hụrụ ndị ọrụ nchekwa juru ebe ahụ ma dịrị njikere ịchekwa udo maka ọgbaghara ọbụla ga-adapụta.

BBC ghọtakwara na Chukwuma Soludo so na ndị na-azọ ọkwa ahụ nakwa onye bubu onyeisi otu ahụ bụ Victor Umeh nọ ebe ahụ ugbua.

A ga-ebu ụzọ nyochaa ndị nọ ebe ahụ n'atụmatụ a kpọrọ "Accreditation" tupu ha gaa tụọ vootu na Dora Akunyili Development Centre dị n'ụzọ Awka - Enugwu.

Gịnị na-akpọtụ n'ime APGA?

Nkwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti ebirila ọkụ ugbua dịka ụda ya na-ada n'otu All Progressive Grand Alliance bụ APGA.

Dịka ụfọdụ akụkọ na-efegharị si kwuo, ngalaba Independent National Electoral Commision na-elekọta ntụliaka wepụrụ APGA na ndị ga-eso wepụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti.

Akwụkwọ edemede BBC Igbo hụrụ anya kwukwara na otu APGA ahụ emeghi ka ha si kwesi n'ịgwa Inec maka ntụliaka imeụlọ ha na-akwado ịme tupuu ha emee ya.

N'ime edemede ọzọ BBC Igbo hụrụ anya, Inec na-adọ otu ahụ aka na ntị maka aha ndị ga-azọ ọkọlọtọ ha nke ha wegaara n'ụlọọrụ INEC.

Ha kwuru sị "o doghi anyị anya na nhọpụta aha ndị a soro usoro ọchịchị onye kwuo uche ya..."

Jude Okeke bụ onye si n'otu ahụ dọbiri na-ebo Victor Oye bụ onyeisi otu ahụ ebubo na ọ ma ụma na-achọ ịwepụ APGA n'otu ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ ahụ.

Mana Oye gwara BBC n'ozi ekwentị na o nweghi nsogbu ọbụla dị n'otu ha.

"E nwero nsogbu ọbụla na APGA. APGA kwụ chịm chịm na-agbanyeghi atumatụ ọjọọ ndị iro anyị."

Ọzọ Oye kwuru "E jim ohere a akpọ ndị otu anyị niile ka ha gbaa mbọ jịkọta aka ọnụ ka anyị kwado APGA maka ọdị mma Naịjirịa, ọ kachasị Anambra steeti"

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: