You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Herman Hembe : APGA ọ na-ala ala ka ọ na-agbanye mgbọrọgwu?
Onye omeiwu Orwase Hembe Herman bụ onye na-anọchite anya mpaghara Konshisha/Vendeikya dị Benue steeti n'Ụlọmeiwu Nta efeelere patị ya bụ APGA aka, wụbanye n'otu APC.
Hembe gbara ndị ụlọomeiwu ama a n'akwụkwọ ozi o detara ha nke Osote onyeisi Ụlọmeiwu Nta bụ Idris Wase gụpụtara n'ọgbakọ ha taa bụ Tuzde, abali asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2020.
Dịka ya bụ akụkọ na-akpọtụ, ajụjụ na-apụta ndị nọ n'ọchịchị nakwa ndị na-ele ihe na-eme na ọgbọ ndọrọndọọchịchị obodo bụ Apga ọ na-adakpọ adakpọ ka ọ na-aga n'ihu?
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance bụ APGA n'aha ịchafụ ya bụ otu ehiwere n'afọ 2003. Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye mbụ ji okoloto patị ahụ were zoọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003.
Onyeisi patị APGA taa bụ Victor Ike Oye.
APGA bidoro iwu nsonso a dịka omeiwu Orwase Hembe Herman na-anọchite anya Konshisha/Vendeikya n'ụlọ omeiwu nta nke Benue steeti sị patị APGA banya nke APC bụ ndị nọ n'ọchịchị.
Osote onyeisi ndị omeiwu nta bụ Ahmed Wase gụpụtara akwụkwọ ozi nke Herman jiri banya otu APC.
Kama onyeisi ndị kacha pee mpe n'ụlọomeiwu nta bụ Ndudi Elumelu kwuru ka Wase kwuo na enweghịzị onye nọ dịka onye nnọchite anya mpaghara Konshisha/Vendeikya.
Mana Wase ekweghị ma sị na ọbụghị etu a ka ndị ọzo siri patị ha banya patị ọzọ na nke Herman agaghị apụ iche.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ma APGA ha eso kwa na ihe a na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijirịa.
Ihe ndị otu APGA nwere ikwu maka ọnọdụ patị ha taa
Don Adinuba onye bụ kọmịshọna mgbasa ozi nke Anambra steeti ma bụrụkwa onye otu pattị Apga kwuru na ha ka kwụ chịm.
O kwuru maka Herman Hembe onye si APGA banye APC sị," Amanyị m onye ọ bụ, kama ọzọọ ọkwa ahụ ọzọ , ọ gaghị emerị n'ihi na ọ bụ maka APGA ka ndị mmadụ ji tụnyere ya".
Adinuba kwuru na ndị mmadụ nwereike isite patị ha nọ banye pati ọzọ.
O kwuru sị, "Anyị ka kwụ chị m".
Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchi nwee ikwu
Onye ọnụ na-erute n'okwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Tochukwu Ezeoke onye bụ kwa onyeisi ụloọrụ ntakụko Njenje Media TV na nke Igboekunie Initiative.
Ezeoke kwuru sị " Mmadụ isite patị ya gbaga pati ọzọ dịka nke Herman Hembe abụghị ihe ọhụrụ, N'ihi na ihe mere mmadụ ji banya otu ndọrondoro na-agbanwe".
Ọ kọwara na ihe ọzọ kpatara ya bụ na otu APC nọ n'ọchịchị nke mere na ndị mmadụ na-achọ ebe ike dị nke bụ na ọ bụrụ na ndị otu PDP nọ n'ọchịchị, na ndị otu ọzo ga-agbagakwa otu PDP.
Ezeoke kwuru na ọ bụ " Ndọrọndọro ochịchị maka ihe afọ ga-eri".
Ọ kọwara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-eji otu pati enweta ihe ha chọrọ.
Gịnị mere otu APGA esighị ike na ebe ndi ọzọ?
Ezeoke kọwara na APGA bụ patị gbara mgbọrọgwụ na Anmabra steeti.
O kwuru sị, "ọtụtụ ndị si Apga banya pati ọzọ abụghị n'Anambra steeti".
Ezeoke gara n'ihu kọwaa sị " APGA bụ Patị wachiri n'Anambra steeti, mgbe ha ga-enwe nsogbu bụ ma ọ bụrụ na onye nọ ugbua dịka Gọvanọ Anambra steeti si APGA gbaga patị ọzọ".
"Dịka ọ dị ugbua, ha ka kwụ chịm"; Tochukwu Ezeoke.
Lee ka otu APGA si kwụrụ n'ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị Naijirịa ụgbua:
Ọkwa Gọvanọ
N'Ụlọomeiwu Nta Disemba 2020
N'Ụlọomeiwu Ukwu
APGA enweghị onye onyeiwu ọbụla na sineti ugbua dịka Victor Umeh bụbu naanị onye APGA nọbụ n'Ụlọomeiwu Ukwu dịka onye na-anọchite anya Anambra Central enweghị elele ịlaghachi dịka Uche Ekweunife weghara ọkwa ahụ n'aha otu PDP. N'ime oche Sineti atọ e nwere n'Anambara steeti; PDP nwee oche abụọ ,ebe Labour pati ji otu oche.