You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Charly Boy Vs Willie Obiano: Gịnị na-esere Charly Boy na Gọvanọ Obiano?
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ọ dịka Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti amaala n'ọnyịa dịka onye mbụ Charles Oputa ji emezu nkwa o kwere na ya ya ga-ebido 'kpọọ ndị sabo aha" n'ihu ọha.
Oputa, onye a ma ama dịka Charly Boy, na-ebo Obiano ebubo ikwe nkwa eme eme.
Iwe gbara Oputa dịka o nwegara Willie akwụkwọ ihe ya na steeti ahụ nwere ike ijikọ aka meere ndị ntọrobịa Anambara mana okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ.
Charly Boy boro ebubo maka ọnọdụ pati APGA enweghị ụlọ nke ha, ndị ntorobịa enweghị ọrụ, ọnọdụ ọdọụgbọelu Anambara na ihe ndị ọzọ.
N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya n'aha @areafada1, o kwuru na "ọtụtụ na-ezitere m mkpesa maka etu Gọvanọ si achị n'Anambara."
"Ndị mmadụ na-ekwu na APGA bụ pati gị enweghị isi ụlọọrụ nke bụ nke ha n'Ọka..."
"I binyeela aka na nkwekọrịta karịrị 500 mana o nweghị nke mịtara ohere nye nde kwuru nde ndị ntorobia Anambara steeti."
"Ụfọdụ na-ajụ ajụjụ banyere atụmatụ ibupụ ụgụ (nke Gọvanọ kwuburu na Anambara na-ebupụ ala Bekee), ma ọ bụzịkwa ihe e kwuru ka a na-eme?"
Charly Boy, onye gbara ama na Ya na Obiano gụkọrọ Sekọndrị bokwara Obiano ebubo ịhapụ APGA bụ pati Ndigbo na-egbunye n'akpa ndị otu APC.
Ọ jụkwara ya Obiano ihe mere ọdọụgbọelu o kwere nkwa ịrụ.
Ihe Obiano sara ya
Mana n'ọsịsa ya, Obiano gwara Charly Boy ka ọ hapụ agwa ụmụaka ma bido mewe ihe ka okenye n'ihi na nka abịala.
Obiano, onye kwuru nke a n'ọnụ Kọmịshiona Mgbasaozi bụ Don Adinuba sị, "Charly Boy dị afọ 70."
"O ruola oge o kwesịrị ime ka Charly Man' ma hapụ Charly Boy."
Ọ gara n'ihu bo ebubo na ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị onye (activist) bụ ndị na-achọ nke ga-aba ha n'akpa.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: