You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwoke agbagbuola nwunye na nwa ha
Ndị uweojii nwụchiri Peter Nielsen, maka echere na ọ bụ ya gburu nwunye bụ onye Naijiria na nwa ha n'ụlọ ha dị na Banana Island, Legos, ụbọchị Tọọsde.
Zainab nwetara ọrụ iguru otu ụlọọrụ egwu Asia a kpọrọ 'Petra Entertainment' n' afọ 2017 ebe o nwetara ụgbọala ọhụrụ, otu ụlọ na Banana Island na amara izisasi egwu ya n'ụlọ egwu ndị ọzọ n'Asịa maka nkesa na mba ụwa.
Ụlọọrụ ndị ebe Zainab Ali-Nielsen,nke a mara dịka Alizee na-arụ e depụtara akwụkwọ gbasara ọnwụ ya na nwa ya. Ha rịorọ ngalaba na-ahụ maka mbịara mbịara ha dịrị njikere ma nye aka na-nyocha ọnwụ ndị ahụ
Peter Nielsen jisike na-ekwu na aka ya kwụ ọtọ, na ọ bụ ebe ọ sị esị lọta ka ọ zuru ozu nwuye ya na nwa ya n'ebe obibi ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti, kwuru n'ezie na ihe mere ma kwukwa na a nwụchiela nwoke ahụ maka igbu ọchụ,maka ziga ndị nyocha na be ya.
O kwuru na onye komishọna uweojii, Edgal Imohimi, enyela iwu ka anwụchie onyee eboro ebubo ma kpochie ya.
"Anyị amaghị ihe butere ọdachi ahụ. Anyị edela ndị embassy ha akwụkwọ ị gwa ha na anyị na-eche"
Dịka akwụkwọ akụkọ Punch siri kwuo, a dọnyela nne na nwa ya bụ Petra n'ụlọozu maka nyocha.