You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebe nwoke nọ gbuo nwanne ya maka ịdụ ụlọ na Sango Ota
Okwudili ji mma oge we beka sia nwanne ya nwoke a na-akpọ Azubike Okoro na nwunye ya bụ Jacinta ebe ha nọ na erị nrị.
BBC Igbo ghọtara na Okwudili mụrụ ọrụ n'aka Azubike ebe ọ na-azụ ahịa osikapa, agwa na ihe ndịọzọ ihe ruru afọ atọ na Azubike ekwesila idu ya n'odibo mana ọ dughị ya.
Otu onye agbatobi ha nọ mgbe ihe a mere a kpọrọ Esther gwara BBC Igbo na ọ bụ okwu ego na-ese n'etiti ụmụ nwanne ahụ.
Ọ sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ Okwudili gburu nwanne ya bụ mbụ ọ nara ya ego ọ na-atụ anya n'aka ya bụ Azubike.
Gee ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a:
E jidere Okwudili ebe ọ na-achọ ị si mmiri dị n'azụ ụlọ obibi ha agba ọsọ maka mkpọtu nwanne ya mere tupu ọ nwụọ.
Ndị uiweoji nọ na-agba Sango Ota kwuru na eburu la Okwudili gaba isi ụlọọrụ ha dị na Abeokuta maka nyocha zuruoke.
Ha sị kwa na ha na-agba mbo ị chọta otu nwoke a kpọrọ Kenneth so Okwudili were gbuo Azubike na nwunye ya.