You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Goolu abụọ Ibrahimovic nyere LA Galaxy mmeri
Zlatan Ibrahimovic ji ọkpụ goolu abụọ jiri mepo ọnọdụ na otu egwuregwu bọọlu LA Galaxy nke mba Amerịka bụ ebe ọnọzị ugbua.
Mpị a ndi LA Galaxy na ndị Los Angeles FC sọọrọ bu egwuregwu nke mbụ Ibrahimovic so ha agba. N'egwuregwu ahụ, Los Angeles FC ji ọkpụ goolu atọ na-aga Galaxy mana he mechara saa ha niile.
Ibrahimovic, bụ onye dị afọ 36, nyere gollu abụọ na ya bụ asọmpị, otu n'ime ha bu nke o ji isi nye na ngwucha.
Ibrahimovic sị; "a nụrụ m ka ndi mmadu na eti 'Anyi chọrọ Zlatan, anyi chọrọ zlatan."
"Ya mere m jiri nye ha Zlatan. Ha na-akwa m, m na-enyechi ha," Onye egwu a kwuru ka agbachara ya bu asọmpị.