You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwaanyị ejirila akaodo kugbuo nne di ya n'Ebonyi steeti
Otu nwaanyi a kpọrọ Chioma Ibina, kụrụ nne di ya nke e kwuru gbara afọ iri asaa na ise akaodo n'isi kụgbuo ya.
Ọdachi a mere n'obodo Ebyia Unuhu dị n'okpuru ọchịchị Abakaliki n'Ebọnyị steeti.
Di Chioma bụ Maduabuchi Ibina, kọwara na ọ bụ mkpọtụ barọ e ji ebu ihe ha nụrụ n'ime abalị ebe elekere iri na abụọ kpọtere otu n'ime nwunye di nne ya.
Nke a mere ka ya na ndị agbataobi soro mkpọtụ ahụ ma hụ nwunye ya ebe ọ kwa barọ dịka ọbara juru ya ahụ.
N'okwu di ya; "Ha sochiri ya ma kwaghe ụzọ hụ nne m ka ọ tọgbọ, ọbara ju ya ahụ dịka e ji aka ọdọ kukwo ya isi."
Maazi Ibina onye kwuru na ya anọghị n'ụlọ oge ihe a mere, kọwara na dịka anya na- efo ndị a n'oke ihe ahụ mere, Chioma gbafuru.
O kwuru, "Anọghị m n'ụlọ, agara m akwamozu ma lọta n'ụtụtụ nụ ihe mere. Ebe ọzọ m nọ hụ nwunye m bụ n'ogige ndị uweojii dị na Nkwegu ebe o kwuru na ọ maghị ihe mere ya oge ya nọ n'ụra nke mere ka ya kwolie buru akaodo kuo nne m ugburo abụọ n'isi."
Onye na-echuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ, Lovet Odah, kwuru n'ezie na mkpamkpa ahụ mere, ma kwuo na ha anwụchiela nwaanyị ahụ.