You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ị ma na ị daala iwu ma ị gbuo onye chọrọ ọnwụ na Naịjirịa?
Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa amaghị ikike ha nwere ịbụ mmadụ nakwa ịbụ onye a mụrụ na mba a.
Amaghị ikike a ebuterela ọtụtụ mmadụ nkwafu ọbara nakwa ịga nga mkpụrụ ọka.
Ihe ndị dị ka etu gị na ndị uweojii si emekọrịta nakwa etu gị na ndị agbataobi gị si emekọrịta nwere ike ịzọ gị maọbụ tinye gị na nsogbu.
Ndị otu na-ahụ maka oke ruru onye bụ Constitutional Rights Awareness and Liberty Initiative (CRALI) bukwasịrị ya onwe ha ime ka ndị Naịjirịa mata ikike ha nwere, nke mere ha jiri rụpụta ihe ga-akụziri gị ikike ndị a.
Ha rụpụtara ihe ha kpọrọ "know your rights Nigeria app" nke ndị US Consulate dị na Naịjirịa kwadoro.
E mere app a ka o nwee ike ikuziri ndị mmadụ ikike ha n'asụsụ ha ga-aghọta, nke gụnyere Igbo, Hausa, Yoruba, Pidgin nakwa bekee.
Onye mepụtara ya bụ Adeola Austin Oyelade, kwuru na e nwere ndị ọkaiwu iri ise (50) ga-enyere gị aka ma zaa gị ajụjụ ọbụla ị nwere ịjụ n'elu app a, n'efu.
Ị ma Ikike gị?
Ọtụtụ ndị mmadụ abanyela n'ime nsogbu ha na-amaghị etu ha ga-esi apụta maka amaghị ikike ha.
- Ị nwere ikike igbu mmadụ ma onye ahụ rịọ gị nke bekee kpọrọ 'euthanasia'?
Na Naịjirịa ị 'nyere mmadụ aka' gbuo onwe ya maka na ọ chọrọ ịnwụ tupu ọrịa ọ na-arịa egbuo ya, iwu weere ya na ị gburu mmadụ. Nke a ga-eme ka ị gaa mkpọrọ.
Ị chọọ iji aka gị gbuo onwe gị nke bekee kpọrọ 'suicide' ma ị mezughị ya, iwu mara gị, ị nwekwara ike ịga nga otu afọ.
- Gịnị ga-eme nwa nwaanyị dị ime a mara ikpe ọnwụ?
Iwu Naịjirịa kwuru na a ga-eche ka nwaanyị ahụ mụọ nwa tupu e gbuo ya, maka na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ bụghị nwa ya.
Lee ikike ndị ọzọ ị nwere: