You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
New coronavirus restriction: Tupu ị palie njem lawa ala Igbo lekwa iwu coronavirus na-achị obodo gị
Dịka ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-akwado ime njem ekeresimesi n'oge coronavirus a.
Ọtụtụ gọvanọ Steetị dị iche iche gụnyere ndị Ọwụwanyanwụ etinyela ụfọdụ iwu ga-ebelata mfesasị ọrịa coronavirus dịka a na-agba ekeresimesi.
Nke a na-abịa dịka minista ahụike bụ Osagie Ehanire sị ka e mepegharịa ụlọ nnyocha, ụlọ ndopu iche nakwa ụlọ ọgwụgwọ niile.
Ọ sị na ọ dịka Naịjirịa abanyela n'agba abụọ nke coronavirus a site n'etu ọnụọgụgụ si arị elu.
Imo Steetị
Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma wepụtara ozi ịdọ aka na ntị maka mfesasị ọrịa coronavirus n'oge ekeresimesi a.
Iwu ndị gụnyere:
- Ọgbakọ ọbụla agaghị akarị mmadụ agahị otu narị ebe ndị a ga-ekpuchi ime ha.
- Ihe e ji asa aka ga-anọ ebe niile ọha na-aga dịka ọdọahịa, ụlọụka dgz. Onye ọbụla ga-ekpuchi imi n'ọha.
- Ndị ọrụ gọọmentị ga-anọzi n'ụlọ ha na-arụ ọrụ malite n'ụbọchị 21 Disemba, 2020.
- Onye ọbụla dara iwu ndị a ka a ga-ekpeike n'ụlọikpe mbugharị.
Anambra Steetị
Kọmishọna mgbasaozi n'Anambra Steetị bụ Don Adenuba wepụtara ozi ịdọ aka na ntị nke gọọmentị ha.
Ọ sị ka ndị mmadụ ghara ịga mmemme ọbụla na-adịghị mkpa, ka ha ghara ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ.
Ka ha gbalịa na-ekpuchi ime ha n'ọha n'oge niile.
Onye ọbụla ahụ na-arịa gbaa mbọ mee nyocha ahụ.
Ebonyi Steetị
Na mgbasaozi Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Dave Umahi nyere n'ụbọchị 18 ọnwa Disemba, ọ sị ka ndị Ebonyi gbasoo iwu niile na-echekwa coronavirus.
Ọ sị ka ebe okpukperechi niile na-enwe ofufe naanị awa abụọ, ka e welite aka n'ime nyocha ahụ.
Machie ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ, onye ọbụla ga-ekpuchi imi n'ọha.
O nyekwara iwu ka ụlọọrụ gọọmentị, ụlọụka, ụlọakwụkọ na ụlọọrụ niile dị n'Imo Steetị gbaso iwu na-achị coronavirus.
Steetị ndị dịka Abia, Enugwu, Legọs ndị ọzọ tinyekwara iwu ọhụrụ a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: