Coronavirus Immunity: I nwereike ibute coronavirus ugboro abụọ?

Ahụ igbochi ọrịa bụ isisekpuntị n'okwu banyere ọrịa coronavirus.

Nsogbu bụrụ na onweghi anyị matụrụ obere ihe.

Kedụ etu ahụ anyị ga-esi gbochie coronavirus?

Akụrụngwa mgbochi ọrịa bụ ihe na-ebuagha n'ahụ anyị megide nje ọbụla ma ọ na-abịa n'ụzọ abụọ.

Nke mbụ bụ nke na-apụ ibuagha ngwa ngwa ọrịa batara n'ahụ mmadụ, gụnyere iwepụta kemịkalụ nakwa ọbara ọcha na-emebisi ebe ọrịa ndị ahụ metụtara.

Mana ụdimịrị nke a apụghị ibuagha megide maọbụ chekwaa gị n'ebe ọrịa coronavirus nọ.

Ihe ahụ gị chọrọ bụ nke a kpọrọ 'Adaptive Immune' bụ nke ga-esogide ọrịa ahụ iji gbochie ya nakwa nke ga-ebuso ya agha.

Ọ na-ewe ahụ mmadụ abalị iri ịmịpụta akụrụgwa ga-ebuso ọrịa coronavirus agha. Onye kachasị arịa ọrịa na-ewepụta nke kachasị sie ike.

Ọ bụrụ na 'Adaptive Immune' a siri ike, ọ ga-echekwa ahụ mmadụ megide ọrịa ruo oge dị anya n'ọdịnịhu.

Oge ole ka nchekwa ahụ ga-anọ ruo?

Ncheta mgbochi ọrịa dịka nke mmadụ, mgbe ụfọdụ ọ na-echeta ụfọdụ ọrịa nke ọma ebe ọ na-echefu ụfọdụ.

Ọrịa coronavirus a kpọrọ Sars-CoV-2, anọtebeghi anya nke iji mara oge mgbochi ahụ ga-anọ, mana e nwere coronavirus isii ọzọ nwereike ịtụpenye azụ maka nke a.

Anọ n'ime ha nwere njirimara ha dịka oyi ma mgbochi ya anaghị adị anya. Nyocha kwuru na onye rịaburu ọrịa a nwereike ibute ya ọzọ n'ime out afọ.

Mana e nwere coronavirus abụọ ọzọ na-akpa ezigbo ike - Ndị nke bute ọrịa iku ume a kpọrọ "Severe Acute Respiratory Syndrome (Sars) na Middle East Respiratoy Syndrome (Mers)".

Nke a hụrụ mgbochi ya dịka afọ ole na ole gachara.

"Ajụjụ abụghị ma ị ga-enwe mgbochi nye ọrịa a, kama ruo mgbe ole" Paul Hunter bụ ọkanmụta ahụike na Mahadum East Aglia kwuru.

O kwukwara "O doro anya na ọ gaghị anọte aka n'ogologo ndụ".

Ọ bụrụ na mgbochi ahụ mmadụ esichaghị ike n'ebe ọrịa Sars nọ, ọ gaghị ejide onye ahụ etu o si jide ya n'oge mbụ ọ rịara ya.

Ndị mmadụ o butetụla ọrịa a ugboro abụọ?

E nweela akụkọ ndị butere coronavirus karịa otu ugboro n'etiti oge na-adịghị anya.

Ụfọdụ sị na ndị mmadụ na-ebuta ọrịa a ugboro abụọ. Ebe ndị ọzọ sị na ọ na-ezo n'ime ahụ mmadụ ruo mgbe ọ ga-apụta ihe ọzọ.

Mana nyocha Sayensị kwenyere na ọ bụ nsogbu emeghi nyocha nke ọma mere e ji agwa ndị mmadụ na o buzighi ọrịa ọzọ.

Enwebeghi mmadụ amaụma bunye ọrịa a ugboro abụọ iji nyocha ikike nchekwa ahụ ya kama ọ gwụla enwe abụọ.

Mana nyocha ziri na ha egosighi njirimara ọrịa a n'obere oge ha butere ya nke ugboro abụọ.

M nwere akụrụngwa mgbochi, enwere m nchekwa?

Nke a abụghị owuweanya na mmadụ agaghị ebute ọrịa a, ya mere otu World Health Organisation ji gbarụọ ihu nye mba ndị ji akwụkwọ a kpọrọ 'Immunity Passports' na-ebuli mmachi ngagharị na mba ha.

Atụmatụ bụ na ọ bụrụ ime nke ọma nq nyocha akụrụngwa mgbochi, I nwereike ịlaghachị n'ọrụ. Nke bara uru nye ndị ọrụ ahụike na-ezutekarị ndị na-egosi njirimara ọrịa n'ebe o buru ibu.

Akụrụngwa mgbochi dị mmadụ n'ahụ dị icheiche, ndị a na-akpọ 'Neutralizing antibodies' bụ ndị na-akpagbu ọrịa ahụ ka ọ ghara imetu mpaghara ahụ ndị ọzọ.

Nyocha e mere mmadụ 175 gbakere na Chaịna gosiri na pesentị 35 n'ime ha nwere 'neutralizing antibodies' n'ogogo obere.

Ya mere World Health Organisation ji sị na akụrụngwa ' Adaptive Immune' nwereike dị oke mkpa na mmadụ ịgbake n'ọrịa a.

Ihe ọzọ bụ na-agbanyeghi na i nwereike nwe nchekwa n'ebe ọrịa a nọ kama ọ pụtaghị na i nweghi ike ibu ya n'ahụ gị ma bufee ya onye ọzọ.

Kedụ Ihe mere nchekwa ahụ ji dị mkpa?

Nchekwa ahụ dị mkpa n'ụzọ dị icheiche, ma ị ga-ebute ọrịa Covid-19 karịa otu ugboro nakwa oge ole ọ ga-ewe.

Nchekwa ahụ a na-emetụta ụdịrị ike ọrịa ga-akpa n'ahụ. Ọ bụrụ na i nwere ya na-agbanyeghi nwa obere, ọ ga-ebelata ụdị ikike ọrịa a n'ahụ gị.

Ị ghọta ọnọdụ nchekwa ahụ ga-enye aka ibuli mmachi ngagharị, nke bụ na a ga-ama ụdịrị ndị ọrịa a ga-emetụta karịa nakwa ndị nwereike ikesa ya.

Ọ bụrụ na o sie ike imepụta nchekwa ga-anọte aka, ọ ga-enyekwa nsogbu ịrụpụta ọgwụ. Maọbụ gbanwee etu a ga-esi ṅụọ ọgwụ ahụ - ọ ga-abụ otu ugboro na ndụ kaọbụ otu ugboro kwa afọ?

Ogologo oge nchekwa ahụ ga-anọ, ga-agwa anyị etu e nwereike iji gbochie mfesasị nje a.

Ihe ndị a bụ ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị na-ajụ, nke a na-enwetebeghi ọsịsa ha.