Infectious Disease: Etu ndị Igbo si eme ndị bu ọrịa na-efe efe n'oge gboo

Dịka ọrịa coronavirus na-anyụ mba ụwa niile ịkpakwụ ugbua, ndị ọkachamara n'okwu ahụike enyela iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ.

N'ihi etu ya bụ ọrịa si efe, onye ọbụla butere ya, ihe mbụ a na-eme bụ iwepụ onye ahụ n'akụkụ ebe mmadụ agaghị na-eru ya nso.

N'akụkụ ụwa niile, ndị mmadụ akọola akụkọ obi mgbawa etu ndị nke ha nwere ọrịa coronavirus si nwụọ na-enweghi onye ọbụla bịara ha nso.

N'ala Igbo n'oge ochie, ihe mere oge ahụ adịchakwaghị iche n'ihe na-eme ugbua.

Ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Tobe Nnamanị, onye mere nnyocha miri emi n'omenala ndị Igbo, gwara BBC na ndị Igbo na-elegara ọrịa na-efe efe anya n'ụzọ abụọ:

Nke mbụ bụ etu o si metụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

Nke abụọ bụ etu o si metụta mmadụ na ndị mmụọ.

Ọrịa na-efe efe n'ala Igbo

Fada Nnamani kwuru na ọrịa na-efe efe ndị Igbo ma gụnyere:

Ahụ ntukasị (Chicken pox, small pox)

Ekpenta

Ito afọ

Otoro

Akpata maọbụ Ịkpata (Measles)

Ihe nwere ike ịkpata ọrịa na-efe efe

N'ihi na ọrịa ndị a abụghị ihe a na-ahụ kwadaa, a na-ewekarị na onye bu ya bụ ọrịa mere arụ nke mere ala ji ata ya ahụhụ.

Oge ụfọdụ o nwere ike ọbụghị onye ahụ n'onwe ya, kama nnanna ya maọbụ onye lọrọ ya ụwa metere ihe ndị mmụọ ji ata ya ahụhụ.

Mana oge ụfọdụkwa ọ bụrụ ihe mmadụ mere mmadụ ibe ya, maọbụkwanụ ihe ọdachi dakwasara mmadụ.

Etu e si eme onye nwere ọrịa na-efe efe

Dịka Fada Nnamanị si kwuo, ọ bụrụ na a chọpụta na mmadụ nwere ọrịa nwere ike ikpochapụ obodo, a ga-eme ngwa ngwa wezụga onye ahụ iche ebe mmadụ na-agaghị na-eru ya nso.

Nke a ka bekee na-akpọ 'quarantine' n'oge ugbua.

Fada Nnamanị kwuru sị: "Ọ bụrụ onye kpara arụ, maọbụ onye ṅụrụ iyi asị, a ga-edopu ya n'ajọ ọhịa."

"Mana ọ bụrụ na ọbụ ihe mmadụ mere ibe ya, maọbụ ọdachi dakwasara mmadụ, a ga-edopu onye ahụ n'ime ụlọ ya."

"E bute nri, a dọwa ya n'ezi ma kụọ ogene maọbụ ekwe iji gwa onye ahụ na a dọwala nri ya."

"Onweghi onye na-eru ya nso. Nke a yitere 'social distancing' anyị na-eme taa."

Etu e si agwọ ọrịa na-efe

Fada Nnamani gara n'ihu kọwaa na e nwere ndị dibịa mgbọrọgwụ na-agwọ ọrịa ndị a n'oge ahụ.

"Ọ bụrụ onye toro afọ, dibia gwọkọchaa mgbọrọgwụ nye ya, ọ nyụsịa ihe ndị dị ya n'afọ, afọ ya adakwaa ọzọ."

"Ọ bụrụkwanụ onye ihe turu n'ahụ, a ga-eji mgbọrọgwụ na ahịhịa dị icheiche gwọkọọ n'ime ude ma nye ya ka ọ na-ete n'ahụ."

Mana, Fada Nnamani kwukwara na onye rịara ụdị ọrịa gbakechaa, a ga-achụkwa aja iji sachaa ala, sachaa obodo tupu ya na ndị mmadụ ebido mekọrịtawa ọzọ.

Ugbua, sayensi emeela ka anyị mata na ụfọdụ ọrịa ndị a abụghị abụmọnụ ndị mmụọ na-akpata ha.

Mana etu e si eme ndị bu ọrịa ndị a n'oge ugbua ka yikwara etu e si eme ha n'oge gboo, nke bụ iwepu ha iche ka ya bụ ọrịa ghara ịgbasa.