Coronavirus Nigeria: Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa eruola 50,000

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Dịka ngalaba mgbochi na mfesa ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' si kwuo ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa akarịala puku iri ise (50,000) ugbua.

Nke a mere ka Naịjirịa bụrụ mba nke atọ n'Afrịka ebe akachasị nwee ndị bu ọrịa. South Africa na Egypt bụ ndị nke mbụ na ndị nke abụọ.

A bịa na Naijiria, Legọs steeti ka ndị bu coronavirus gbara kasaa; mmadụ 17,092 bu ya bụ ọrịa na steeti ahụ.

Akụkọ ọma dị na ya bụ na ọtụtụ ndị butere ya bụ ọrịa agbakeela ugbua, mana nke ọjọọ bụ na ndị ya bụ ọrịa gburula fọrọ obere ihe ka ha ruo otu puku.

Ọnụọgụgụ gosiri na ndị butere ya bụ ọrịa gbaliri elu kamgbe gọọmentị kpọghechara obodo n'ọnwa Mee.

Mana ọtụtụ ndị ọkacha mara na-ekwu na a mabeghi eziokwu mmadụ ole nwere ya bụ ọrịa na Naịjirịa n'ihi na anaghị eme nnyoch otu o kwesịrị.

Ndị ọrụ ahụike so ebuso ọrịa Covid-19 agha na Naịjirịa ekwukwaala ugboro ugboro na gọọmentị anaghị enye ha akụrụngwa zuru oke ha ga-eji chekwaa onwe ha bụ nke kpọrọ 'Personal Protective Equipments. (PPE).

Ugbua, ụlọ okpukperechi niile amalitekwala ọzọ ebe ụmụakwụkwọ nọ na sekọndịrị nke isii alaghachila ụlọakwụkwọ ma malite ule ha.

Mana gbadatụ ka ị hụ etu coronavirus si emetụta ndị mmadụ na mba ụwa niile.

Kemgbe coronavirus jiri bata na Naịjirịa site n'aka otu onye mba Spen na Febụwarị 27, 2020, ọtụtụ ihe gbanwere maka etu nje coronavirus a si egbu mmadụ.

Ihe ndị dịka ngagharị, ahịa na nke kacha nke, mmechi obodo. a anyị lele akara ndị buterela coronavirus n'oge Naịjirịa busoro ya bụ agha a ọgụ.

Mana ụlọọrụ na-elebaanya n'ihe gbasara ọrịa na-efegharị bụ National Center for Disease Control - NCDC n'ịchafu bụ ndị na-enye akara ndị niile buterela nje a na Naịjirịa kwa ụbọchị

N'ụbọchi 22 Epreel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

N'ụbọchi 21 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

N'ụbọchi 20 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

Ụbọch 19 Eprel, 2020 nweterela ndị buterela coronavirus bụ:

Ụbọchị a bụ mgbe ndị NCDC pụtara rịọ arịrịọ maka:

Na 18 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

N'ụbọchi 17 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

N'ụbọchi 16 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

N'ụbọchi 15 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ:

Lee ndị buterela coronavirus na Naịjirịa n'Eprel 14, 2020:

Na Eprel 13, 2020 ndị buterla coronavirus bụ:

Na Eprel 12, 2020 ndị buterela nje a bụ:

Na Eprel 11, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 10, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 10, 2020 ka onyeisi ndị NCDC na BBC nwere mkparịtaụka a kpọrọ 'Kwuo Uche gị':

Ndị buterela nje a na Naịjirịa n'ụbọchị Eprel 9, 2020 dị ebe a:

Ndị buterela nje a na Naịjirịa n'ụbọchị Eprel 8, 2020 dị ebe a:

N'ụbọchị Eprel 7, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 6, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 5, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 4, 2020 ndị ọrụ NCDC kwupụtara ndeghie ha dere maka ndị buterela nje a ha depụtara ebe a:

N'ụbọchị Eprel 3, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 2, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Eprel 1, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Maachị 31, 2020 ndị buterela nje a bụ:

N'ụbọchị Maachị 30, 2020 ndị buterela nje a bụ: