You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coronavirus n'Afrịka: O meela ọnwa isii coronavirus batara Afrịka
Otu jikọrọ mba niile dị n'Afrịka bụ 'African Union' akpọọla oku ka onye ọbụla kee ajị n'ume dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus agafeela otu nde.
Dịka ndị AU si kwuo, ọkara ndị niile bu ya bụ ọrịa n'Afrịka bụ na Saụt Afrịka.
Ha kwukwara na ihe na-eme na Tanzania na-awa ha isi n'ihi na mba ahụ enweghị ezi ọnụọgụgụ maka ndị bu ya bụ ọrịa.
Onyeisi ngalaba mgbochi ọrịa na-efe efe na AU bụ John Nkengasong kwuru sị: "Anyị arịọla Tanzania ka ha nye anyị ezigbo ọnụọgụgụ maka ndị bu Covid-19 mana ha enyebeghị anyị ọsịsa ziri ezi."
Ndị ọkacha mara ekwuola na onweghi onye ma nke bụ eziokwu mmadụ ole bu coronavirus n'Afrịka n'ihi na ọnụọgụgụ ya ezuchaghị oke.
Ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla n'Afrịka niile n'ihi ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 690,000 agbakeela.
John Nkengasong kwuru na nnyocha Covid-19 e merela n'Afrịka agafeela nde asatọ, mana ọ bụrụ na ihe gara etu e si chee, o kwesila ịgafe nde 13.
Ijipt bụ mba izizi coronavirus batara n'Afrịka n'ọnwa Febrụwarị 2020, dịka ọ gachara izuụka atọ ya bụ ọrịa banyere na Yurop.
Ka ọ dị ugbua, Saụt Afrịka na Ijipt bụ mba abụọ ọrịa a kacha akpa ike n'Afrịka niile.
Mana John Nkengasong gwara BBC na ụlọọrụ ya jikwa ọdụ anya ele mba ụfọdụ ebe ya bụ ọrịa ji nwayọ agbalite dịka Naịjirịa, Gana, Kenya, Etiopia, Sudan, Zambịa na Zimbabwe.
Ndị ọkachamara etoola Afrịka maka mbọ ha gbara igbochi mfesa coronavirus, ọkachasị etu ha si kpọchie mba ha n'oge.
Nke a kpatara na ndị bu coronavirus n'Afrịka dị nta karịa ndị nke Yurop (otu nde na ụma) nakwa ndị nke Amerịka (nde anọ na ụma).
Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ n'Afrịka anaghị eme nnyocha maka ọrịa a etu o kwesịrị.
Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi nke e mepụtara na Mahadum Oxford dịka ọ na-arụ ọrụ. A gbara ụfọdụ ndị mmadụ ya bụ ọgwụ na Saụt Afrịka.
Mana John Nkengasong na-ekwu na ihe ga-aka enye aka bụ ndị mmadụ iyi akwa mkpuchi imi Bekee kpọrọ 'facemask'.
- Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara coronavirus
- Etu ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ si echere coronavirus aka mgba
- N'ikpeazụ Onyeisiala Buhari ekwuola okwu n'ihe onyonyo banyere coronavirus
- Gọọmentị ga-agbachi ọdọụgbọelu Legọs na Abuja
- Coronavirus: Ihe o ji raa ahụ ịkwụsị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ya
- Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus
- I nwereike ibute coronavirus site n'ahụrụ?
Ihe nkiri ga-amasị gị: