Pretty Mike: Ihe mere m jiri buru ụmụnwaanyị di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Na mkparịtaụka Pretty Mike na BBC Igbo, Pretty Mike sị na o bu ihe ọma n'obi wee buru ụmụnwaanyị ndị ahụ di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba.

Ọ sị na o mere ya ka o nye ụmụnwaanyị ndị ahụ obi ụtọ.

Pretty Mike kwukwara ọtụtụ ihe maka ndụ ya na mkparịtaụka a.

Pretty Mike kpọrọ ụmụnwaanyị isii dị ime bia agbamakwụkọ Williams Uchemba na Brunella Oscar were isi na ha bu nwa ya n'otu n'otu.

Ka Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii di ime wuchiri, ndị mmadụ wee na-elegharị anya.

Mana o bighi ebe ahụ, ha gara n'ọtụtụ igwe soshial midia, kpụrụ ya n'ọnụ, mere ka o wee wukarịa ndị gbara akwụkwọ.

Onye na-eme ihe nkiri nakwa akpa ọchị a ma ama bụ Uchemba Williams echizuola n'iza di Brunella Oscar.

Ha gbara akwụkwọ nke ụka ụnyaahụ bụ Nọvemba 21, afọ 2020 na Lagos n'isi ụlọụka Dominion City dị na Leeki Phase 1.

Lee ụfọdụ foto si na agbamaakwụkwọ ha pụta:

Uchemba na nwunye ya mere agbara nkwụ ha n'izuụka gara aga.

Lee Brunella Oscar Nwolisa bụ oriakụ Williams Uchemba na ihe ị na-amaghị maka ya

Brunella Oscar bụzị oriaku ọkpaọchị a ma ama aha ya bụ Williams Uchemba.

Foto ebe ha gbara akwụkwọ omenaala wuru ewu ọfụma na soshal midia na ngwụcha izu ụka a n'Alor dị n'Anambra steeti.

Nke a mere dịka Uchemba wepụtachara foto ya na Brunella Oscar sere n'elu soshal midia n'oge gara aga wey na-ekwu na oge eruola o ga-eji lụọ nwaanyị.

Uchemba mechara kwuo na agbamaakwụkwọ nke ụka ha ga-eme n'ụbọchị Novemba 21,2020.

Mana onye ka Brunella Oscar Nwolisa bụzi oriakụ Uchemba bụ?

  • Ọ bụ nwa ụkọchukwu Christian Osita Nwolisa ụlọụka akpọrọ Eternal Life Christian Chapel dị na mba England
  • Ọ bụ dọkịta gụrụ akwụkwọ na mba England
  • Ọ gụchara mahadum n'afọ 2018
  • Ọ bụ onye Anambra steeti

Lee ụfọdụ foto si n'agbamakwụkwọ ha:

Kedụ Williams Uchemba na Brunella si zute onwe ha?

Ụlọọrụ Naịja Digest mgbasaozi depụtara na Nwolisa kwuru na ọ hụrụ onyonyo Uchemba na Facebook ma zigara ya ozi n'ọba ozi n'afọ 2016 ya makana ọ nụrụ n'uche ya na ọ hụla di ya.

N'akụkọ ahụ o kwuru na mgbe ọ gwara ndị ọyị ya na ọ hụla di ya na ha che na ọ na-ayị ara.

Brunella kwuru na Uchemba sara ozi ya ma jụọ ebe o si, o mechara gwa ya na o si n'ebe nne na nna ya bụ Nwolisa agaghị ekwe ka ọlụọ nwa ya.

Onye bụ di ya bụ Wiliams Uche Mba?

Williams Uche Mba bụ otu n'ime ndị na-eme ihe ejije ama ama na Naijirịa.

Mba bidoro na soshal Midịa dịka onye na-akpa ọchị ma mechaa banye n'iti egwu nwa mgbe nta

E ji "I dont like what i hate" were mara dịka onye na-akpa ọchị.

Mba bidoro "Project One mIllion" nke ga-enyere ndị mmadu aka ịgụ akwụkwọ, ịmụta aka ọrụ ma ị hụ kwa na ndị mmadụ nwere ebe obibi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: