Uche Mefor: Nnamdị Kanu ka bụkwa onye ndu m

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Uche Mefor ekwuola hoohaa na ya na-akwanyere Mazị Nnamdị Kanu ugwu dịka onye ndu ya.

Mefor, bụ otu n'ime ndị ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), depụtara nke a n'akara Facebook ya ụbọchị Fraịde.

Mana ọ gara n'ihu kwuo na mbọ ya na ndị ọzọ na-agba bụ iji hụ na e nwetara obodo Biafra nke mmadụ niile nọ n'ime ya ga-enwe ikike ibi ndụ ya ma nwekwaa ikike dịịrị ya na-atụghị egwu ọbụla.

Ụfọdụ ndị mmadụ malitere iche na Mefor na Kanu na-ese okwu, oge o kwuru ka onye ọbụla ghara itinye okwu okpuperechi n'ime okwu Biafra.

E jila ọchịchọ Biafra gbakwụnyere okpukperechi

N'ọnwa Jun 2020, Mefor kwuru ka ndị otu Ipob ghara iji okpukperechi gbakwụnyere ọchịchọ Biafra.

O kwuru nke a n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara 'Facebook' ya.

Cheta na Nnamdi Kanu ka na-anata nkatọ gbasara ihe nkiri ebe o kwuru na ndị ụkọchukwu niile nọ na Naịjirịa bụ ndị ọjọọ.

Asari Dokubo bụkwa onye ndọrọndọrọ Niger Delta bokwara Kanu ebubo na ọ ga-achọ ka ndị otu ya niile mee ihe niile o kwuru nke gụnyere omenala, okpukperechi ya dgz.

Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Mefor kwuru

  • Ọchịchọ Biafra gbadoro ụkwụ na nhatanha, ikpe kwụ ọtọ, ikike diri onye na nwereonwe kachasị mkpa nke ndị otu Ipob kwesiri iji obi ha niile chekwa
  • Ọ bụ ihe ọjọ iji ọchịchọ Biafra gbakwunye n'okpukperechi
  • A ma m ihe m na-eme ma kweteka na a nam eme ihe ga-abara ọchịchọ Biafra uru.
  • Kpe m ikpe site na ihe m na-eme maka ọchịchọ Biafra na abụghị maka ihe ndị mmadụ gwara gị
  • Ndị Biafra gụnyere ọtụtụ ndị mmadụ si na okpukperechi dị iche iche nakwa ezinụlọ dị iche iche, ọ bụrụ na ịkwanyeghịrị okpukperechi ndị mmadụ ugwu, echena na ha ga-akwanyere gị ugwu.
  • Ikparia m maka okpukperechi, oge na-abịa mgbe m ga-amalite saghachiwe ndị na-eme otu a.
  • Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndịisi okpukperechi na-eme ihe ọbụla sọrọ ha mana ọ dịghị mma ipụta na-akatọ okpukperechi ha.
  • Kedu ka ọchịchọ Biafra ga-esi bia maọbụrụ na anyị na-akparị onwe anyị maka okpukperechi?
  • Onweghị okpukperechi kachasị mma.
  • Onye akpọzi na m onye osu imi makana onye na-akpọ mmadụ osu imi bụkwa ihe ọ ma anya ya.
  • E nwere ndị ọjọọ batara n'etiti Ipob na-emebisi ihe , anyị kwesiri igbaru ihu maka ndị a makana anyị ṅwụrụ iyi ichekwa onwe anyị.
  • Na ngwụcha, o kwuru na ihe mere o ji dị mkpa ka ndị otu ya gbado anya n'ọchịchọ Biafra ghara ikwe ka ndị mmadụ megharịa ha anya bụ makana ụwa na-ekiri ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: