'Nnamdi Kanu na-arụrụ gọọmenti Naịjirịa ọrụ' - Ralph Uwazuruike

Ralph Uwazuruike bụ onyendu ndị Moverment for the Survival of the Sovereign State of Biafra (MASSOB) a saala Nnamdi Kanu okwu ọ gwara ya.

N'edemede pụtara n'akwụkwọ akụkọ Punch ụbọchị Fraịde, Onye mgbasaozi MASSOB bụ Sundau Okereafor dọrọ Nnamdị Kanu aka na nti sị ya kwusi ịkparị onyeisi MASSOB bụ Ralph Uwazuruike.

Ọ sịrị Kanu na ọbụrụ na ike dị ya, ya lọta Naịjiria bịa zọwa mnwereonwe Biafra, karịa ị nọ n'ofesi na-eme ọnụ.

Okereafor kwuru na Kanu enweghi ike iweta Biafra ma ọ nọrọ n'ofesi.

Gee Ralph Uwazuruike ntị n'olu ebe a

Mgbe BBC kpọrọ Ralph Uwazuruike ịmata ma ya bụ okwu Okereafor kwuru ọ nọ n'izu ha.

Uwazuruike sị na ọnweghị mgbe ya ji zie Okerefor ya gbachitere ya n'aka Nnamdi kanu.

O kwukwara na Kanu abịaghị ịzọta Biafra n'ezie maka na ọ ịbịara ịkpasa ihe ha na-eme.

Mbọ niile BBC gbara ịnwete ndị otu Kanu maka ịzara ọnụ ha kpụrụ afọ n'ala.

Akụkọ ga-amasị gị