You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị 'baby factory' si eme ka nwaanyị tụrụ ime adigboroja
Ọ bụ eziokwu na ịmụta nwa baara uru n'ezinaụlọ ọbụla, ọ bụ isi isekpuntị dị n'alụmdinanwunye.
Mana etu ọtụtụ ezinaụlọ si achọsi nwa ike ugbua na-edubazi ha n'aka ndị aghụghọ maọbụ ịga zuo nwa onye ọzọ.
Ụlọọrụ na-ebuagha megide ịtụ mgbere mmadụ na Naịjirịa bụ 'National Agency for Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP)' tinyere ọnụ n'okwu banyere nke a.
Onyeisi ụlọọrụ a nke ngalaba Legọs bụ Aganran Ganiu kọwara usoro ọhụrụ ndị na-atụ mgbere ụmụaka ji aghọ ezinaụlọ na-achọ nwa aghụghọ.
Ganiu sị na ndị na-enwe ụlọ ebe a na-edosa ụmụagbọghọ ka ndị ntoroọbịa tụwa ha ime iji mụta ụmụaka ha ga-ere ere.
Ọ sị na ọ bụrụ na nwaanyị na-achọ nwa bịa n'ụlọọgwụ ha, ha ga-ekwe ya nkwa ime ka ọ mụta nwa.
Ha ga-enye nwaanyị a ọgwụ ma sị ya gbalịa hụ na ya na di ya nwere mmekọ ka o nwee ike tụrụ ime.
N'ihe dịka ọnwa ole na ole, ọgwụ ahụ ga-eme ka afọ nwaanyị a na-eto ka ọ tụrụla ime, ọnọdụ ahụ ga-agbanwekwa ka nke onye dị ime.
N'otu aka, ahụ ndị a ga-agba mbọ hụ na otu nwagbọghọ ọzọ nọ n'ụlọọgwụ ha a ga-adị ime ka e nwee ike kunye ya nwaanyị ahụ.
Ha ga na-atụle nwagbọghọ ahụ iji mara mgbe ime ga-eme ya, n'otu aka ahụ, a ga-eme ka ime mewekwuo nwaanyị a na-achọ nwa.
A ga-akpọba nwaanyị a n'ime ụlọ imụ nwa ma gbaa ya ọgwụ nke na ọ gaghị ama onwe ya, mana o teta ha kuru nwa nwagbọghọ ahụ kunye ya.
Nwaanyị a ga-eche na ọ mụọla nwa kama ọ gaghị ama na nwa ọhụrụ abụghị nwa ọ mụrụ n'afọ ya.
Ganiu sị na ọtụtụ ezinaụlọ adabala n'aka ndị na-amaghị na nwa a sị nwunye mụrụ abụghị nke ha.
Ọ sị na ụfọdụ na-achọpụta ma ọ bụrụ e nwere etu ha si chọrọ ime njem n'ofesi a sị ka e mee nyocha 'DNA'.
Ganiu sị na ụdị ndị a jupụtara na mpaghara Ọwụwanyanwụ na mbụ mana ugbua ha zuola Naịjirịa ọnụ.
Ọ sị na ndị ọrụ ha na ndị ọrụ nchekwa anwụchiela ụfọdụ ndị a site na kepu kepu nakwa ama ndị mmadụ gbaara ha.
Ọ sị ha ka na-arịọ ka ndị mmadụ na-agbara ha ama ụfọdụ ebe ndị dọkịta adịgboroja a nọ iji nye aka nwuchie ha.