Gọọmentị Abia anapụla m na ezinaụlọ m ara n'ọnụ - Otu na ndị nkuzi a chụrụ n'ọrụ

Onye nkuzi

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụfọdụ ndị nkuzi so n'ime ndị a chụrụ n'ọrụ n'Abia Steetị akwaala arịrị etu e si napụ ha ara n'ọnụ n'otu ntabi anya.

Otu onye na-akụzi n'otu ụlọakwụkwọ dị n'Aba achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na nke a bụ ihe mwute nye ya nakwa ndị otu ya a chụrụ n'ọrụ.

Ya bụ onye nkuzi so na ndị ọrụ nkuzi dị 5,666 n'ime 5,853 e nyere ọrụ n'afọ 2018 ruo 2020 mana Gọọmenti Abịa chụrụ ha n'ọrụ ụbọchị Wenezde.

Nwa amadị ahụ kọwara na ya tinyere akwụkwọ ịchọ ọrụ n'usoro ziri ezi, lee ule, a gbaa ya ajụjụọnụ, tupu e were ya n'ọrụ dịka onye nkuzi.

Ọ sị n'ime akwụkwọ ozi nnabata n'ọrụ e nyere ya na o nweghi ihe dịka e jighi 'waiver' bụ ebe gọọmentị gbakwasịrị ụkwụ chụọ ha n'ọrụ.

Ụmụakwụkwọ na-akuzi onwe ha

Ebe foto si, AFP

Ọ sị na kemgbe ọ malitere ọrụ n'ọnwa Maachị 2019 rue mgbe a chụrụ ha n'ọrụ na o ritubeghi ụgwọọnwa.

Onye nkuzi a sị na ugbua a gbawara ya aka ọrụ "kedụ ihe o ji azụ ezinaụlọ ya?"

Ọ kpọkwara oku ka gọọmentị chegharịa uche n'ihe ha mere ha.

Ihe otu ndị nkuzi (NUT) kwuru

Workers Day n'Abia

Ebe foto si, Igwe Kelechi

Nkọwa foto, NUT bụ otu ndị nkụzi pụtara 'National Union of Teachers' na Bekee

N'okwu achụmnọrụ ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị nkuzi n'Aba-North bụ Charles Njoku bụ gwara BBC Igbo na otu ndị nkuzi anọkọbeghi kpaa maka ya, na mgbe ha zukọchara na ozi ha ga-apụta.

Ọ sị na ndị otu ha a chụrụ n'ọrụ bụ ndị e nyere ọrụ nchere oge ruo mgbe gọvanọ ga-enye ikike (waiver) ka e wee ha n'ọrụ n'uju.

Ọ sị na ha gbasoro usoro e ji ewe ndị nkuzi n'ọrụ dịka itinye akwụkwọ, ile ule nakwa ịza ajụjụọnụ tupu ha amalite ọrụ.

Njoku nyere gọọmentị ndụmọdụ ka ha chọọ ụzọ nabata ndị nkuzi a n'ọrụ n'ihi na ndị a nwere ọrụ ha na-arụ n'ụlọakwụkwọ.

Ọ sị na ọtụtụ n'ime ha arụọla ọrụ otu afọ "a bịa ugbua kwụsị ha ọrụ n'ike na-akwụghị ụgwọ.'

Kedụ ihe gọọmentị kwuru?

Njirimara gọọmentị Abia

Ebe foto si, Abia State Government

Mana odeakwụkwọ mịnịstrị agụmaakwụkwọ Sekọndịrị bụ Lawrence Ogbonna bụ onye gọọmentị nyere ezumike nka n'ike sị sị na o nweghi ihe ọ ga-ekwu na ọ bụ n'aka kọmishọna agụmaakwụkwọ ka ọ dị n'aka ịsa ajụjụ banyere ya.

Mana kọmishọna agụmaakwụkwọ n'Abia Steetị bụ ọkammụta K.C Nwangwa gwara BBC Igbo na ndị a esighi usoro ziri ezi bata n'ọrụ.

Ọ sị na Gọvanọ Okezie Ikpeazu machiri iwe ndị mmadụ n'ọrụ ma ọ bụrụ na o sighi n'aka ya.

Kama na odeakwụkwọ ministri agụmaakwụkwọ gara n'ihu na-enye ndị mmadụ ọrụ buru n'obi na gọvanọ ga-akwado ya.

Nwanga sị na e meziri nnyocha chọpụta na ọtụtụ na-arụ ọrụ n'enweghi ikike ọrụ, na ọ bụ ya mere gọvanọ ji nye iwu ka ha kwụsị.

Ọ sị na o nweghị ndị gọọmentị chụrụ n'ọrụ makana onweghi ndị gọọmentị were n'ọrụ na mbụ, nke o ji eji ha ụgwọọnwa.

"Gọọmentị ọ na-achụ ndị ọ na-eweghi n'ọrụ?" Ngwangwa kwuru.

Kama na ọ bụrụ ndịisi ụlọakwụkwọ sị na ha chọrọ ndị nkuzi, na a ga-esikwa n'ime mmadụ puku ise were ndị nkuzi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: