Edo state Assembly: E mechiela ụlọomeiwu Edo steeti dịka a malịtere ịrụgharị ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mba Amerịka akatọọla ihe na-eme n'Edo steeti dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akụkọ isi dịka ntuliaka gọvanọ na-abịa nso na steeti ahụ.

N'ozi ha wepụtar n'akara Twitter ha ụbọchị Fraide, ha kwuru na "Akụkọ na-apụta etu ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Edo steeti si akawanye njọ nakwa ihe ndị o metụtara na-eme adịghị anyị obi mma."

"Nke kachasị njọ bụ ebubo na ndị ọrụ nchekwa na-etinye sị aka ha n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Kemgbe abalị ole na ole gara aga, Edo steeti dịka ebe a na-eme iihe ejije dịka abụọ kachasị ewu ewu na steeti ahụ bụ PDP na APC na-azọ aka ka aka.

Onyeisiala Muhammadụ Buhari nọrọ n'obi gọọmenti dị n'Abuja ụbọchị Fraide Muhammadu Buhari dọnyere Osagie Ize-Iyamu ukwu dịka onye ga-efeere APC ọkọlọtọ na ntuliaka gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị 19 nke ọnwa Septemba.

Buhari na Osagie Ize-Iyamu

Ebe foto si, Presidency

Godwin Obaseki eboola Hope Uzodinma, Oshiomole ebubo atụmatụ ikposa ọchịchị ya

Edo State House of Assembly

Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki nyere iwu n'ụbọchị Tọzde ka e wepu elu ụlọomeiwu nke steeti ahụ iji gbochi ndị omeiwu ịnwe nzụkọ ha.

Nke a na-abịa dịka ya na ndị uweojii gbochiburu ụzọ ụlọomeiwu ahụ kwatara ya n'ụtụtụ ụbọchị taa bụ Tọzde.

Ọ chụrụ ndị uweojii ahụ ọsọ ụkwụ eru ala tupu o nye iwu ka ewepu elu ụlọ ahụ dị n'isiobodo steeti ahụ bụ Benin.

Obaseki onye kọwaara BBC sitere n'olu ọnụ na-ekwuru ya bụ Crusoe Osagie na ihe a mere bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa gọvanọ otu steeti na-anwa ibute ọgbaghara na steeti ya dịka a na-akwado ịme ntuliaka steeti ahụ n'ọnwa Sepụtemba.

"Ọ bụ Adams Oshiomhole na ndị otu APC gụnyere Hope Uzodimma chọrọ iji ike weghara ụlọomeiwu steeti ahụ"

Cheta na APC họpụtara Hope Uzodimma dịka onyeisi otu ọ dịrị ịchụrụ Ize-Iyamu vootu na ntụlịaka ọkwa gọvanọ na-abịa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

"Anyị nụrụ na ha gara kpụọ 'Mace' adịgboroja jiri ya wakpo ụlọomeiwu (nke a na-arụgharị ugbua) iji kpokọba ụlọomeiwu ọzọ n'ụtụtụ Tọzde."

O kwuru na obi adịghị ya mma na ọ bụ ndị okenye kwesiri ị na-ekpokata ndị mmadụ na-achọ ibute ọnọdụ ọgbaghara.

O jikwa ohere ahụ kpọọ oku ka Onyeisiala Buhari nakwa ndị ọrụ nchekwa dị icheiche bịa tinye ọnụ n'okwu a.

Cheta na ọ bụ ụnyaahụ bụ Wernezde ka ndị ụlọomeiwu chụturu osote onyeisi ụlọomeiwu Yekini Idiaye ahụ n'ọkwa ma dochie ya.

Nke a mere dịka Idiaye du ndị omeiwu anọ gaa nleta Ize-Iyamu na bee ya iji gosi na ha kwụnyere ya na ntuliaka na-abịa.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: