You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Foreign students in US: Ụjọ ji anyị na e nwere ike ịchụpụ anyị - Nwata Akwụkwọ Naịjirịa
Uzochi Agbanelo bụ Nwafọ Naịjirịa na-agụ akwụkwọ na Mahadum Georgia, mba Amerịka kọwara etu iwu sị na a ga-achụla ụmụakwụkwọ si na mba ọzọ ga-eji metụta ya.
Iwu a nke ụlọọrụ ọpụpụ na mbata tinyere sị na ọ bụrụ na nwata akwụkwọ nwereike ịmụ ihe n'elu ịntanet, na ọ baghị uru ka o biri n'Amerịka na-agụ akwụkwọ.
Mana Agbanelo sị na iwu a na-atụ ya ụjọ ma na-enyekwa ya oke echichi, n'agbanyeghi na o metụtachaghị ya.
Ọ sị na mahadum ya sị na ha ga na-aga ọmụmụ ihe ụfọdụ n'ụlọakwụkwọ ebe ụfọdụ ga-abụ n'elu ịntanet.
Kama na ọ bụrụ na ha gbanyee sị na ọ bụzi n'ịntanet na nke a pụtara na ọ ga-eso na ndị a ga-achụlata mgbe oge ahụ ruru.
Ọ sị na ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n'Amerịka na-amụ ihe n'elu ịntanet na ọ pụtakwara na a ga-achụlacha ụmụakwụkwọ ndị a si na mba ọzọ.
Agbanelo jụrụ "Kedụ ihe ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị a ga-eme maọbụrụ mba ha enweghi igwe ịntanet dị mma"?
Ọ sị kwara na atụmatụ a adịghị mma maka na ụgwọ akwụkwọ ndị a na-akwụ ji ihe ruru ugboro ise karịa nke ụmụafọ Amerịka na-akwụ.
Na ọ bụ ha mefuchaa ego niile a a bịa chụlaa ha mba ha si bịa?
Agbanelo sị ka ndị Amerịka sepụ aka n'atụmatụ a ugbua ọrịa coronavirus na-arị elu n'ihi na o nweghi onye maara na ọ ga-adị etu a.
Na ọ bụrụ na a sị ha lawa ugbua na ọ ga-abụ itinye ahụike ha n'ihe izendụ.
Mba Amerịka ọ ga-achụlata ụmụ Naịjirịa ga-akwụkwọ na mba ha?
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata n'Amerịka kwuru n'ụbọchị Mọnde na ha ga-achụla ndị si mba ọzọ na-agụ akwụkwọ n'obodo ha maọbụrụ na ụlọakwụkwọ ha na-akụzi ihe n'elu ịntanet.
A mabeghi ụmụakwụkwọ ole iwu a nwereike imetụta mana ụmụakwụkwọ si mba ọzọ bụ otu ụzọ kachasị enye mahadum ndị dị n'Amerịka ego.
Ha sị na a ga-anapụ ụmụakwụkwọ ndị a ikike ibi n'Amerịka ma ọ bụrụ na ụlọakwụkwọ ha ga-agụ akwụkwọ n'elu ịntanetị. Na a ga-atụga ha ebe ọzọ maọbụ achụghachị ha na mba ọbụla ha si bịa.
Ụlọakwụkwọ ndị dị n'Amerịka na-akwado ịmalite kwa agụmaakwụkwọ ọzọ n'agbanyeghi ọgbaghara coronavirus ka dị ugbua.
Mahadum Havard kwuru n'ụbọchị Mọnde na ha ga-ewepụta usoro agụmaakwụkwọ nke afọ 2020 na 2021 n'ịntanet.
Cheta na onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump tinyere mmachị ọhụrụ metụtara etu e si abata na mba Amerịka na nso nso n'ihi coronavirus.
Kedụ etu nke a ga-eji metụta ụmụ Naịjirịa?
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa nọ na mba Amerịka ugbua na-agụ akwụkwọ na ngalaba dị iche iche ebe ndị ọzọ ka na-achọ ụzọ ha ga-eji nwete akwụkwọ ikike ịgafe.
Iwu a ga-emetụta ndị dị etu a maka na e nwereike ịchụlata ha maọbụ jụụ inye ha akwụkwọ ikike ịga mba a maọbụrụ na ụlọakwụkwọ ha na-agụ akwụkwọ n'ịntanet.
O nwekwara ike iwepu ohere ụmụ Naịjirịa ndị a nwere iji inwete ọrụ n'Amerịka ma ọ bụrụ na a chụlata ha.