America Visa: Ihe Naịjirịa ga-eme ka Amerịka gbapere ha ụzọ ime njem

Gọọmentị mba Amerịka enyela Naịjirịa ọnọdụ ihe ha ga-eme ka e mepere ha ọnụ ụzọ mba ha.

Onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Mary Beth Leonard kwụpụtara nke a mgbe o zutere mịnịsta ndị ọrụ bụ Chris Ngige.

Nke a na-abịa dịka Amerịka tinyere aha Naịjirịa na mba ndị ha agaghị enye akwụkwọ njem bịa biri n'Amerịka.

Amerịka sị na ọ bụ maka ọnọdụ ọjọọ nchekwa dị na mba ndị a gụnyere Eritrea, Sudan, Tanzania, Kyrgyzstan and Myanmar.

Kedụ ihe ha chọrọ ka Naịjirịa mee?

1. Mary Beth Leonard bụ onye na-anọchiteanya Amerịka n'ime Naịjirịa kwuru ụfọdụ ihe gọọmenti ha sị ka Naịjirịa mee.

Ọ sị na ọ bụrụ na Naịjirịa wulite ọba ozi banyere njirimara ụmụafọ ya a kpọrọ 'data intelligence' nke ọma.

Amerịka sị na nke a ga-enyere mba ha aka inyocha nwafọ Naịjirịa ọbụla na-abata na mba ha.

2. Ha kwuru na Naịjirịa ga-agbalị hazie igwe nkekọrịta ozi ha na ndị Amerịka nke ọma.

Leonard sị na ọ bụrụ na Naịjirịa mee nke a na ha ga-elebanya iwepụ mmachi ahụ a machiri ha.

Kedụ ndị mmachi na-emetutaghị?

Mba Amerịka sị na mmachị a emetụtaghị ndị bi n'Amerịka ugbua, ndị na-aga ịgụ akwụkwọ, na ndị mere njem nlereanya.

Kama na ọ bụ naanị ndị na-achọ akwụkwọ ị ga biri n'Amerịka a kpọrọ 'Permanent visa'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: