You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
US Visa Fee: Lee ego ole ọ ga-efu gị inweta 'visa' Amerịka
Malite n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ọnụ ego e ji enweta "visa" mba Amerịka ga-arị.
Nke a bụ ozi ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka wepụtara n'ụbọchị Tuuzde.
Ha kọwara na iwu ala ha kwuru na ha ga-akpaso mba ọbụla agwa etu mba ahụ si akpaso ha agwa.
E mee e megwara anaghị apụ okwu
Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kọwaa, a na-ana ndị mba Amerịka ego dị elu tupu ha enweta akwụkwọ ịbata Naịjirịa.
"Ọnụ ego ọ na-ewe onye Amerịka inweta "visa" Naịjirịa dị elu karịa ọnụ ego ọ na-ewe ndị Naịjirịa inweta "visa" Amerịka."
"Kamgbe mbido afọ 2018, gọọmentị Amerịka na-arịọ gọọmentị Naịjiria ka a gbanwee nke a."
"Mana dịka ọnwa iri na asatọ gachara, gọọmentị Naịjirịa agbanwebeghi ya."
"Nke a mere ngalaba a kpọrọ "U.S. Department of State" wepụta ọnụ ego ọhụrụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ na "visa" Amerịka."
Akwụkwọ ozi ahụ kọwakwara na ọbụ naanị ndị akwadoro "visa" ha ga-akwụ ụgwọ ọhụrụ a e tinyere.
Onye ọbụla akwadoghi "visa" ya agaghị akwụ ya.
Ọ gakwara n'ihu kọwaa na onye Naịjirịa ọbụla ga-akwụrịrị ụgwọ ọhụrụ a tupu e nye ya "visa" ọhụrụ, agbanyeghi obodo ọbụla onye ahụ nọ wee tinye akwụkwọ.
Ma nwata ma okenye ga-akwụrịrị ya bụ ụgwọ.
Ọ bụkwa n'ụlọ "embassy" nke Amerịka ka a ga-akwụ ụgwọ ahụ, ọbụghị n'ụlọ akụ.
Ego ole bụ "visa" Naịjirịa
Onye Amerịka chọrọ ịbịa Naịjirịa ga-akwụ $160 (N59,200) iji gbata "visa".
Ọ bụrụ onye bịara ịrụ ọrụ, onye ahụ ga-akwụkwa $160 ọzọ iji gbata ikike a kpọrọ "Temporary Work Permit" (TWP).
E nwekwara ego ọzọ ($160) nke a kpọrọ "Subject to Regularization (STR) Visa Fees".
Ha niile pụtara $480 (N177,600) ma ọ bụrụ onye Amerịka bịara ịrụ ọrụ na Naịjiria.
Onye bịara naanị maka nleta maọbụ nlereanya ga-akwụ $320 (N118,400).
N'agbanyeghi ego ndị a, ego Amerịka na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata, pekarịrị ego ole ndị mba Briten na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata.
Lee ihe gosiri nke a:
Ego ole ka "visa" Amerịka bụ?
Visa B1/B2 bụ nke a na-enye ndị na-aga Amerịka maka azụmaahịa, ebe F1/F2 bụ nke ụmụ akwụkwọ.
Ọnụ ego ha bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $110 (N40,700).
Nke a pụtara na onye e nyere visa a ga-akwụzi $270 (N99,900).
Visa ogoogo "H" bụ nke nwa mgbe nta a na-enye ndị ọrụ kwa mgbe maọbụ ndị gara ọzụzụ na-agaghị anọte aka.
Ọnụ ego ya bụ $190 (N70,300). Ugbua, agbakwụnyela ya $180 (N66,600), nke pụtara $370 (N136,900).
Visa ogoogo "I" bụ nke a na-enye ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ mgbasa ozi.
Ọnụ ego ya bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $210 (N77,700), nke pụtara $370 (N136,900).
Visa ogoogo "L" bụ nke a na-enye ndị ụlọọrụ ha wegara na mba Amerịka (Intracompany Transferees).
Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $303 (N112,110), nke pụtara $493 (N182,410)
Visa ogoogo "R" bụ nke a na-enye ndị ọrụ okpukperechi.
Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $80 (N29,600), nke pụtara $270 (N99,900).
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Ndị mmadụ na-etinye ọnụ na mbuli ọnụ ego "visa" a.
@adeyanjudeji kwuru na ụmụ Naịjirịa ga-amarịrị ihe.
@paul_nwachukwu kwuru na nke ahụ gosiri na onweghizi mba na-akwanyere Naịjirịa ugwu.
Mana @woyet kwenyere na gọọmentị Naịjirịa bu ụzọ chọọ okwu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: