Minimum wage: Lee mgbe anyị ga-ebido kwụwa ndị ọrụ anyị

Ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ nke bụ puku naịra iri atọ (N30,000), ka na-apụta okwu.

Ndị otu jikọrọ ndị ọrụ Naijiria bụ "Nigeria Labour Congress" nọ n'ọgbakọ ha Ụbọchị Monde baa mba ma dọọ gọọmenti aka na ntị ka a malite kwụwa ha opekatampe ọhụrụ ahụ.

N'aka nke ọzọ, akụkọ kọkwara na gọọmenti Kaduna Steeti ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ n'ọnwa Septemba.

Mana ndị gọọmentị Ọwụwa Anyanwụ kwuru na ha ga-amalite ịkwụ ụgwọ a mgbe ọbụla gọọmentị etiti bidoro ịkwụ ya.

Dịka C-Don Adinuba, kọmịshọna mgbasa ozi na Anambra State, siri kwuo, Gọvanọ Willie Obiano kwetara na ọ ga-akwụ ụgwọ ahụ.

Mana ọ ga-abụ ma gọọmentị etiti na ndị NLC kwekọrịtachaa.

"Gọọmentị etiti ewepụtabeghi usoro a ga-eji kwụọ ya bụ ụgwọ."

"A ka na-eme nkwekọrịta ahụ n'Abuja."

"I kwụọ onye "level 1" puku naira iri atọ, ego ole ka ị ga-akwụ onye 'level 2' na 'level 3'?

"Mgbe ọbụla e wepụtara nkwekọrịta, anyị ga-amalite kwụwa."

Emmanuel Uzo, onyeisi mgbasa ozi nke Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi, kwukwara otu ihe ahụ.

"O nweghị mgbe gọvanọ Ebonyi ji kwuo na ọ gaghị akwụ.

"Kama nwata agaghị ebu nna ya ụzọ mụta diọkpara."

"Anyị na-eche ka gọọmentị etiti bido kwụwa tupu anyị ebido."

Uzo kwukwara na gọọmenti kwesịrị ibuli ego a na-enye steeti ọbụla kwa ọnwa.

Nke ahụ ga-enye aka ma a malite ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ a.

Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye ma mgbe ndị ọrụ n'ala Igbo ga-esoro ibe ha rachawa pịọm.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari enyere iwu ka e bido ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị etiti ụgwọ opekatampe ọhụrụ.

Mana nke ahụ metụtara naanị ndị ụgwọ ọnwa ha erubughi puku naịra iri atọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: