New Minimum Wage: Ndị gọvanọ na Buhari ga-enwe nzụkọ taa

Ọgbakọ ndị gọvanọ steeti dị ịcheịche akpọrọ Nigerian Governor's Forum na bekee ekwuola na ha na onyeisiala Buhari ga-enwe nzụkọ taa.

Onye na ahụ maka mgbasa ozi n'otu ahụ bụ Abdulrazaque Bello-Barkindo kwuru na isiokwu nzụkọ ahụ ga-abụ ịkwekọrịta n'ego olee a ga-akwụ dịka ụgwọ opekatampe na Naịjirịa.

Okwu a bịara dịka ndị gọvanọ nwechara nzụkọ n'ime onwe ha maka ya bụ okwu ma kwuo na ha nwere olileanya na ihe niile gbasara ya bụ okwu ga-ebi tupu ngwụcha afọ a.

Cheta na ndị ọrụ na-achọ N30,000 ebe gọọmentị na-achọ ịkwụ N24,000 na ndị gọvanọ N22,500.

Esemokwu gbasara ụgwọ opekatampe a butere abụbọ ọrụ nakwa ngaghrị iwe dị icheiche na mpaghara Naịjirịa niile.

N'otu aka ahụ, otu akpọrọ NECA n'aha ịchafụ n'ahụ maka ndị na-enye ọrụ na-akwanye gọọmentị etiti ọkụ n'ike si ha kpebie maka ụgwọ opekatampe a tupu afọ agwụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị