You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sexual violence: Ị ma ebe ị ga-agbaga ọsọ enyemaka ma ị gabiga mwakpo?
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ọ bụrụ na ị gabigala mwakpo, ọ na abụ ihe dị mwute nakwa na-emerụ mmadụ ahụ na echiche.
Mana ị ma na o nwere ọtụtụ ebe na-abụghị ụlọọrụ ndị uweojii ewepụtara iche maka nlekọta ụmụnwaanyị maọbụ ụmụaka gabigara mwakpo?
Ụfọdụ n'ime ha bụ nke gọọmentị hibere ebe ndị ọzọ bụ ngalaba dị icheiche weputara onwe ha kachasị maka okwu a.
BBC Igbo gakwara n'okporoụzọ iju ndị mmadụ ihe ha chere ekwesiri ime ndi e jidere na mwakpo nwoke na nwaanyị.
Lee ihe ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ zara anyị maka nke a.
Lee ebe ndị ịnwere ike inweta enyemaka na nchekwa maọbụrụ na ịgabigala mwakpo mbụ
Abia steeti
Vicar Hope Foundation nke nwunye Okezie Ikpeazu hibere inye ụmụnwaanyị aka n'efu.
Ọ dị na 183 Ndume Otuka Bypass, Umuahia n'Abia steeti.
Akara ekwentị ha bụ 0808 192 1217.
Abuja steeti
Ngalaba nwere ụlọọgwụ na-ahụ maka mwakpo ụmụnwaanyị.
Ọ dị na Social Development Secretariat (SDS) Ogogo abụọ, Cyprian Ekwensi House, Arts & Culture Complex Area 10, Garki Abuja.
Akara ekwentị ha bụ 08077111126
Anambara steeti
N'Anambara, ngalaba ehibere maka ụmụnwaanyị na ụmụaka nwere ike ịnabata gị.
Dịka kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba si kwuo "ọ bụ ọrụ ha ịnabata ụmụnwaanyị akpasoro iko n'ike".
Ụlọọrụ ha dị na Dora Akunyili Development centre dị n'okporoụzọ Enugu - Onitsha.
Enugu steeti
WACOL Women House
Ọ dị na No 9 Dr. Mathias Ilo Avenue, New Town, New Haven Extension, n'akụkụ New Haven Secondary School, Enugu.
Akara ekwentị ha bụ 08037102015; 07035779083; 08066092184.
Ebe ọzọ bụ:
Tamar Sexual Assault Referral Center
Ọ dị n'ụlọọgwụ FSP dị n'ihu ụlọ bụbu Institute of Management and Technology (IMT), Enugu.
Akara ekwentị ha bụ 09091333000, 09092777000.
Imo steeti
Ngalaba na-ahụ maka ụmụ nwaanyị na ọdịmma ọha mmadụ
Ị ga-achọta ha na Block 7, Imo State Secretariat, Port Harcourt Road, PMB 1597, Imo, Owerri, Nigeria
Akara ekwentị ha bụ 083-230121-233592.
Legọs steeti
Mirabel Centre dị n'ime ụlọọgwụ Lasuth.
Ọ dị na Lasuth, Ikeja General Hospital Road, Ikeja
Akara ekwentị ha bụ 08155770000, 08115554877, 08187243648, 08176275732, 07013491769.
Ebe ọzọ bụ
Nigerian Institute of Medical Research (NIMR)
Ọ dị na Edmund Crescent, Yaba, Legọs.
Akara ekwentị ha bụ 08033065683
Rivas steeti
Ọ bụ otu ndị dọkịta kpọrọ onwe ha "Doctors without Borders" maọbụ "Medecins sans Frontieres" n'asụsụ French hibere ebe ahụ.
Ha nwere ụlọọrụ abụọ dị na ụlọọgwụ Orogbum dị na Ogbunabali nakwa ụlọọgwụ Eliozu dị na Pọtakọt.
Akara ekwentị ha bụ 09033555455 nakwa 07058890060. Ha na-emepe kwa n'elekere niile dị n'ụbọchị.
Ọ bụrụ na ị bighị na steeti ndị edepụtara ebe a, i nwereike ị bụ ụzọ gaa na nke ndị uweojii nakwa ụlọọgwụ gọọmentị etiti ọbụla dị gị nso.
Ngalaba ndị ọzọ na-enye ndị gabigara mwakpo aka bụ NAPTIP - Isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja mana ha nwere ụlọọrụ dị na steeti ọbụla na Naịjirịa.
Ị nwereike inweta ha na 07030000203 nakwa 08002255627847.
Ọ bụrụ na gị maọbụ onye ọbụla (nwata na okenye) na-agabiga mwakpo, biko kpọtụrụ ndị a maka enyemaka.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị