You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rape in Nigeria: Ebubo ụgha maka mwakpo na-emebi agha a na-ebuso mwakpo - Uti Nwachukwu
Onye a ma ama n'ihe onyonyo bụ Uti Nwachukwu abaala mba maka ebubo mwakpo otu nwaanyị boro ya.
Ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị na akara ahụ kpọrọ aha ya bụ akara adigboroja nakwa na o nweghi isi.
Ọ bụ otu nwata nwaanyị kpọrọ onwe ya Kambili Korie bụ onye boro Nwachukwu ebubo nke a.
Uti depụtara n'akara instagram ya ka ndị ahụ gaa kpesa ya n'aka ndị uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya.
"Agwala m ndị ahụ ha gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii maọbụrụ na m mere nke a n'ezie mana o nwebeghị onye bịara"
O kwukwara na ebubo a wutere ya nke ukwuu n'ihi na ọ bụ onye na-achọ ọdịmma nakwa ikike ruru ụmụnwaanyị mgbe niile.
"A bụ m nwoke nwere ụmụnne ndị nwaanyị anọ, nke a mere ihe niile gbasara ọdịmma ụmụnwaanyị jiri masị m" ka o kwuru
Mgbe BBC Igbo gara ị me nyocha gbasara ya bụ okwu maọbụ gbaa nwa agbọghọ boro ya bụ ebubo ajụjụ ọnụ, ọ zaghị anyị chaa chaa.
Ihe ọzọ anyị hụrụ bụ na emechiela akara Twitter o jiri depụta ya bụ ozi akpọrọ @KambiliKorie.
Uti kwukwara na n'agbanyeghi nke a, ọ ka ga-aga n'ihu na nyocha ndị uweojii na-eme n'ihi na ọ chọrọ ịzọpụta aha ya kpam kpam!
Kemgbe a wakporo ma gbuo otu nwa agbọghọ bụ Uwavera n'obodo Benin, ọtụtụ ụmụnwaanyị amalitela ikwu ihe anya ha hụrụ na mwakpo nakwa ịkpọpụta aha ndị wakporo ha.
Ndị ọzọ a ma ama e boro ebubo mwakpo
Ụfọdụ ụmụnwaanyị pụtara na soshal midia na-ebo ụfọdụ ndị a ma ama ebubo mwakpo. Ndị a gụnyere;
1. Brymo Olawale
Otiegwu a ma ama bụ Brymo Olawale so na ndị eboro ebubo mwakpo n'elu soshal midia.
Brymo n'onwe ya apụtala ị gọ ya bụ ebubo ma kwuo na ụlọ egwu ya nakwa gọọmentị Legọs steeti etinyela aka ọnụ ịme nyocha banyere ebubo ahụ
2. Dapo Adebanjo (D'banj)
D'banj bụ otiegwu ọtụtụ ụmụ Naịjirịa hụrụ n'anya bụ aha ọzọ wuru ewu na soshal midia dịka e boro ya ebubo mwakpo.
Rue ugbua o nwebeghi ihe o kwuru gbasara ya bụ ebubo.
3. Tobechukwu Victor Okoh (Peruzzi)
Peruzzi bụ ezi ọyị Davido sokwa na ndị aha ha banyere n'ebubo mwakpo nwaanyị.
O gbughị kwa oge n'ịgọrọ isi onwe ya site n'akara Twitter ya ebe o dere na "ọ bụghị onye mwakpo"
4. Chimaobi Owoh (Zoro)
Otiegwu eji egwu "Ijele" mara bụ Zoro apụtala kwuo ka o si metụta ya.
O kwuru na otu nwa agbọghọ boro ya ebubo mwakpo ma kwukwa na mgbe ndị ụlọọrụ ya chọrọ ịnwe mkparịtaụka, ya bụ nwa ada etie mkpu "mmegbu"
Lee ihe o dere ebe a
Akụkọ ndị ga-amasị gị: