You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ise ị ga-eme iji chekwa onwe gi ma ị nọrọ n'ime Taxi
Okwu na-ewu n'elu igwe okwu siri n'otu nwata nwanyi etipụla mkpụ maka mwakpo onye n'anya ụgbọala chọrọ ị wakpo ya.
Nke a bụtere arụmụka n'elu igwe okwu ebe ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ụdị ihe a na-eme.
Anyị na ndị abụọ ọnụ n'eru n'okwu gbasara nchekwa nwere nkata were wepụta ụzọ ise ị ga-ejị were chekwa onwe gị iji gbochi mwakpo n'ịme ụgbọala.
Kwụsị ị ga-ebe ọbụla na onwe gị
Ndị okachamara na okwu nchekwa gwara BBC na ihe na-egbochikari mwakpo bụ ma ndị mmadụ nọkọrita na-eme njem.
Ọ bụru na ị nweghị onye gị na ya ga-eso ọ dị kwa mma ka ị gwa ndị ezin'ụlọ gị maọbụ ndị enyi gị.
Saa anya gi
Tupu ịbanye ụgbọala ahụ ị nwere ike ịkpọ mmadụ gwa ha n'iru onye n'anya ụgbọala ahụ kọwara ha otu ụgbọala ha dị.
Mara ụzọ ebe ị na-aga
Ọbụrụ na ịmaghị ụzọ, ọ ga-adịrị onye chọrọ ịwakpo gị mfe ịme uche ya.
Muru anya dịrị njịkere
Ụra dịnma na-ahụ mana ị rahụ ụra n'ịme ụgbọala taxi ga-enye onye ọ bụla chọrọ ịwakpo gi ohere iji mee ya.
Akwụsị la ebe ọbụla ọkụ adịghị
Ọ dị mfe ịwakpo mmadụ n'ebe ọkụ adịghị nya mere ị ga-eji diri nche maka ebe gbara ọchịchịrị.
Ndị ọnụ n'eru n'okwu na ihe gbasara nchekwa nwekwara ndụmọdụ ha nyere ndị na-anya ụgbọala taxi.
Ha sị ha gaa ịbụte mmadụ, ha dịrị nkwucha gaa ọsọ ọsọ n'ebe ha nwere ike ikọwa dịka ụlọ obibi maọbụ ụlọ ọrụ maọbụ ụlọ akwukwo iji gbochi ndị ohi ịwakpo ha.