Social Media Week Lagos: Ihe mere ndị mmadụ ji ekwu maka ya

    • Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Izuụka maka soshal midia bụ nke a kpọrọ 'Social Medial Week' bụ ogbakọ a na-eme na Legos kwa afọ ọbụla.

Ọ bụ ebe ndị na-arụ ọrụ dị icheiche na-agbakọ iji nwe mkparịtaụka gbasara ihe ndị na-ewu ewu na ihe ndị ọzọ dị mkpa metụtara etu ndị mmadụ na ụlọọrụ si eji ịntanetị eme ihe.

Afọ a ga-eme ya afọ asatọ kamgbe e jiri hibe ya izuụka a na Naịjirịa.

Ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche na Naịjirịa na mba dị icheiche abịa maka ya.

Ọgbakọ SMW nke afọ a bidoro na ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị rụọ 28.

Isiokwu nke agbadoro ụkwụ na ya n'afọ a bụ 'HUMAN.X', ọ bụ mkparịtaụka dị mkpa metụtara ọdịmma mmadụ dịka o siri gbasa ụlọọrụ ndị na-arụpụta ihe na ụzọ obibi n'obodo.

Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya:

BBC Africa nwere otu mkparịtaụka abụọ.

Nke mbụ mere n'ụbọchị Mọnde, isiokwu ya bụ 'Ịkwalite ọnụọgụgụ ndị na-ege gị ntị n'ịntanetị'.

Nke abụọ mere n'ụbọchị Frịdae. Isiokwụ ya bụ 'Nkwalite olu ụmụnwaanyị'.

Onyeisi BBC News Igbo Adline Okere so na ya.

Akụkọ ga-amasị gị: