Ihe ndị ntọ kwuru mgbe ha tọọrọ ndị obodo anyị mmadụ 177- Emir

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Emir obodo a na-akpọ Kurmin Wali, Kajuru dị na Kaduna steeti akọwaala ihe ndị ntọ gwara ha mgbe ha na-awakpo obodo ahụ na-atọrọ ndị mmadụ.

Ndị ntọ tọrọ mmadụ ruru 177 n'ụbọchị ụka gara aga.

Mana Emir nke Kurmin Wali bụ Ishaku Ishaku E. Sidi kwuru na ndị ntọ ahụ gwara ha na ndị obodo ha napụrụ ha ọgbatumtum ruru iri na asaa na ọ bụ ya mere obodo ahụ niile ga-akwụ ụgwọ ya.

Ishaku Ishaku E. Sidi sị na ha gara kpụrụ ndị nọ n'ụlọụka ma kpọrọ ha baa ime ọhịa.

Gọvanọ Uba Sani agaala njem nleta n'ebe a tọrọ ndị ụka Kraịst karịrị 100 na Kajuru, Kaduna Steeti

Gọvanọ Uba Sani na-achị Kaduna steeti agaala njem nleta n'ebe ahụ a tọọrọ ndị ụka Kraịst.

Nke na-eme dịka ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị ntọ wakporo otu obodo ma tọrọ ndị ụka na steeti ahụ.

Uba Sani zutere ọtụtụ ezinaụlọ mkpamkpa ahụ metụtara ọkachasị ndị meruru ahụ mgbe ha na-agba ọsọ ndụ ha.

A tọọrọ mmadụ karịrị otu narị n'ụlọ ụka atọ dị na n'okpru ọchịchị Kajuru, na Kaduna steeti.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ntọrị ahụ

Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị ụka Kraịst n'obodo Kurmin Wali dị n'okpuru ọchịchị Kajuru na Kaduna Steeti.

Nke a na-abịa dịka ndị uweojii mere ka o doo anya na ozi ahụ ha wepụtara n'abalị Tuzde 20 Jenụwarị 2026 bụ n'ihi na ha enweghị ozi zuruoke gbasara ndị ahụ a tọọrọ nakwa ihe ndị ọzọ banyere etu o si mee.

Ozi onu na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Benjamin Hundeyin wepụtara kwuru na nnyocha ha mere gosiri na e nwere ndị a tọọrọ.

Hundeyin ekwughị mmadụ ole a tọrọ mana ọ gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ndị uweojii kara aka n'okpuru ọchịchị Kajuru nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu iji nye ọhanaeze bi ebe ahụ ezi nchekwa.

Ọ gara n'ihu kwuo na a na-eme nnyocha iji chọpụta ndị ahụ a tọọrọ ma zọpụta ha n'aka ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ha.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ndị ụka Kraịst 177 n'ụlọụka atọ dị n'obodo Kurmin Wali, mana mmadụ 11 gbapụrụ nke pụtara na mmadụ karịrị 160 nọ n'aka ndị ojiegbe ahụ.

Akwụkwọ ndekọ BBC hụrụ n'ụbọchị Tuzde 20 Jenụwarị, 2026 gosiri aha mmadụ ruru 160, mana a maghị ma ndekọ ahụ ọ bụ eziokwu.

Onye hụrụ oge ihe mere gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọụka ahụ n'elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọchị Sọnde 18 Jenụwarị, 2026.

N'okwu ya: "Ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ ịgbapụ ọsọ mana ndị ojiegbe ahụ gbara obodo ahụ gburugburu, ha chịkọtara ọtụtụ ndị mmadụ ma kpọrọ ha banye n'ime ọhịa".

Ndị obodo kwuru na ụlọụka o metụtara gụnyere Cherubim and Seraphim Movement Church (C&S) 1, Cherubim and Seraphim Movement Church (C&S) 2 na ụlọụka Evangelical Church Winning All (ECWA).

Onyeisioche otu Christian Association of Nigeria na mpaghara ugwu Naịjirịa bụ Ụkọchukwu Joseph Hayab kwuru na ọnụọgụgụ ndị ojiegbe buru ibu.

Ndị obodo kwuru na ndị ojiegbe ahụ zuuru ego nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ ma kwuo na ka ọ dị ugbua, egwu na-atụ onye niile n'obodo ha.

Ndị ojiegbe a na-awakpo ma na-atọrọ ọtụtụ mmadụ na mpaghara ugwu Naịjirịa iji napụta ezinaụlọ ndị a tọrọ ego. Oge ụfọdụ ndị ojiegbe a na-egbu ụfọdụ ndị ha tọọrọ n'abanyeghị na ha anatala ego.

Ihe Amnesty International kwuru

N'aka nke ọzọ, otu na-ahụ maka ikike nke mmadụ bụ Amnesty International akatọọla agwa ndị uweojii Naịjirịa, n'ihi agụgọ ha gọrọ gbasara ndị ahụ a tọọrọ.

Ha kwuru na ọ dị mkpa na gọọmenti mapụtara atụmatụ ga-egbochi oke ntọrị ndị ojiegbe na-atọrị ndị mmadụ na Naịjirịa kwa mgbe kwa mgbe.