A kpụpụla Diezani Madueke n'ụlọikpe dị na London maka ebubo iri ngarị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A kpụpụla onye bụbu Minista mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke n'ụlọikpe Southwark Crown dị na Lọndọn, mba United Kingdom maka nnụrụ ikpe ya n'ebubo iri ngarị.

Ikpe a bụ nke a tụrụ anya ịmalite nke ọma n'ụbọchị 26 Jenụwarị 2026.

Alison-Madueke bụ Minista nwaanyị mbụ hụrụ maka mmanụ agbidi site n'afọ 2010 ruo 2015.

Ọ bụkwa nwaanyị mbụ bụ Onyeisioche otu jikọtara mba ndị na-ebupụ mmanụ agbidi bụ Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC).

Madueke dị afọ 65 bụ onye e buuru ụzọ nwuchie na Lọndọn n'ọnwa Ọktoba 2015, mana e mechara gbapụta ya. Ọ gọnarịkwara ebubo isii e boro ya.

N'afọ 2023 ka ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mba United Kingdom boro ya ebubo iri ngarị n'agbata afọ 2011 na 2015.

Ụlọọrụ ahụ sịrị "na ha na-enyo enyo na Diezani Alison-Madueke ji ike mee ihe n'ụzọ na-ezighị ezi na Naịjirịa ma nata onyinye ego maka inye ọrụ ruru nde paụnd.

Dịka ha si kwuo, Diezani ritere uru otu narị puku euro £100,000 ($134,000), ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze, iji ụgbọelu nkeonwe eme njem nakwa inwe ọtụtụ ihe onwunwe na Lọndọn nakwa ihe ndị ọzọ.

A na-atụ anya na ikpe ya a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị ga-erụ izuụka iri maọbụ iri na abụọ.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ a kpọrọ aha n'ikpe a bụ Doye Agama, onye nke bịara n'ụlọikpe site n'ihe oyonyoo nakwa Olatimbo Ayinde, onye nke bịara n'ụlọikpe na mmadụ.