You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Emeka Umeagbalasi: Ihe i kwesịrị ịma maka nwoke a sị nyere Amerịka ozi maka ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa
Otu n'ime ajụjụ dị iche iche ndị mmadụ na-ajụ maka akụkọ onye na-ere 'screwdriver' n'Ọnịcha, Anambra steeti mere Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ji wakpoo mpaghara ugwu Naịjirịa bụ "kedụ onye bụ nwoke ahụ"?.
Ajụjụ ndị ọzọ gunyere kedụ ka Amerịka si hapụ usoro niile ha si enweta ozi gaa dabere n'ama nwoke na-ere screwdriver gbaara ha ma wakpo Naịjirịa?
Akụkọ a kọwara maka nwoke ahụ ụlọmgbasaozi New York Times dere ihe gbasara ya nakwa usoro o si wepụta ndekọ maka etu e si egbu ndị ụka kraịst na Naịjirịa.
Kedụ ihe New York Times dere banyere nwoke a
Akụkọ ụlọọrụ mgbasaozi New York Times bipụtara, kwuru na aha nwoke ahụ na-ere screwdriver bụ Emeka Umeagbalasi.
N'akụkọ ahụ, ha kọwara etu o si wepụta ndekọ banyere ndị ụka Kraịst e gburu na Naịjirịa ma kwuo na ụlọ ahịa ebe ọ na-ere 'screwdriver' perempe n'ahịa dị n'Ọnịcha, Anambra steeti.
Ha sị na ndekọ "nwoke ahụ na-ere screwdriver bụkwa ihe ndị omeiwu mba Amerịka gbadoro ụkwụ na nnyocha ha na-eme maka ndị ụka Kraịst e gburu na Naịjirịa".
Ihe ị kwesiri ịma maka Emeka Umeagbalasi
New York Times kọwara Emeka Umeagbalasi dịka nwoke na-ere screwdriver ma bụrụ onye hiwere otu a na-akpọ International Society for civil Liberties and the Rule of Law, nke a na-akpọ 'Intersociety' n'ịchafụ.
- Ezigbo aha ya bụ Emekla Godfrey Benjamin Umeagbalasi.
- A mụrụ ya n'afọ 1969.
- Ọ bụ onye Ezinifite dị n'okpuru ọchịchị Aguata, Anambra steeti, Naịjirịa ma gụọ maka "Criminology" na "Security studies' na mahadum. Ọ bụkwa onye ji ego achụ ego nke bekee kpọrọ 'businessman'.
- O nwere nzere 'Peace studies na Conflict Resolution" ma bụrụ onye a ma ama maka ikike dịịrị mmadụ.
- Emeka bụkwa onye isi ọtụtụ otu dị iche iche na ngalaba ikike dịịrị mmadụ n'ime ihe dị n'iwu.
Ụfọdụ akwụkwọ Umeagbalasi dere maka ikike dịịrị mmadụ
Umeagbalasi edeela akwụkwọ dị iche iche gbasara ikike dịịrị mmadụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Dịka akara ya na Linkedin si kwuo, ọ bụrụla onye sọ kpọọ oku banyere ikike dịịrị mmadụ ma mee nnyocha dị iche iche.
Aha akwụkwọ ndị o bipụtara gunyere na oge o bipụtara ha:
- Welcome to breeding Republic of Nigeria - Maachị 2017
- The Ezu River Massacre - Juun 20217
- The Military Massecre in Eastern Nigeria - Ọgọst 2015 -Sepụtemba 2017 ma bipụta ya n'ọnwa Jenuwarị 2029 ma gbakwụnye ya ihe na Jenụwarị 2020.
Ugbua ọ sị na ya na-ede akwụkwọ ọzọ ọ kpọrọ "The Noble Ways of Life the Igbo People of Africa" nke a na-atụ anya ya ngwangwa o dechara ya.