Abacha Loot: Mba Amerịka abụrụla agada gbachiri ụzọ n'ego ọzọ chọrọ ịbata Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka akwụchiela n'ụzo na a gaghị enye Naịjirịa nde dọla otu narị ọzọ bụ nke a hụtara n'ọbaego Sani Abacha na mba ha.
Iwe Amerịka bụ na Naịjirịa na onye ha sị nyerela Abacha aka bupu ego a bụ Abubakar Bagudu, ga-eke ya bụ ego.
Bagudu bụ aka na-achị Kebbi steeti ugbua.
Ndị Shia 100 enwerela onwe ha

Ebe foto si, IMN
Ụlọikpe dị na Kaduna steeti ekwuola na ikpe amaghị mmadụ otu narị bụ ndị otu Shia akpọrọ Islamic Movement in Naijiria.
Nke a na-ebute ikpe ha nke gọọmentị Kaduna steeti gbara ha akwụkwọ maka mwakpo ndịagha Naịjirịa n'afọ 2015, n'isi njedebe.
Onyeisiala mba Lesotho ekwuola ihe mere o ji ọ bịaghị ụlọikpe

Ebe foto si, AFP
Thomas Thabane bụ onyeisiala mba Lesotho agọrọla ọnụ ya sị na ọ bụghị ọsọ ka ọ gbagara na mba Saụt Afrịka, kama na ọ bụ ahụ ya ka ọ gara ilekọta.
Nke a na-abịa dịka ọ ghara ịpụta n'ụlọikpe bịa zara ọnụ ya ugboro abụọ maka ogbugbu nwunye ya nke mbụ.
N'egwuregwu,
Jurgen Klopp bụ onye nchịkọta Liverpool ekwuola na Jordan Henderson bụ onye ndu ya agaghị agba bọolụ n'ime izu atọ na-abịa maka mmerụ ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụweojii na-enyocha ụlọ gbara ụmụaka ọkụ

Ndị uweojii Anambra Steeti sị na ha ka na-enyocha ọkụ gbagburu ụmụaka atọ n'ọkpuruọchịchị Iheala nke steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ọkụ gbagburu ụmụaka atọ ahụ.
Akwụkwọ akụkọ buru na nne na nna ụmụaka ahụ hapụrụ ha pụọ n'abalị mgbe ya bụ ọkụ gbara ụlọ ha.
Akụkọ ndị a kwukwara na nna ụmụaka ahụ gara itiegwu ebe a na-eme emume ebe nne ha gbaara arabanko nke ya gawa.
Ha sị na ndị agbataobi gwara ha na nne ha mụnyere uriọkụ n'ụlọ ahụ wee pụọwa.
Ha chere na ọ bụ ya bụ uriọkụ Bekee a kpọrọ "candle' ka ya bụ ọkụ si banye n'ụlọ were gbagbuo ụmụaka ahụ na ngwongwo ndị ọzọ.
NSCDC sị na ha ga-akpụpụ ehi ụlọikpe

Ebe foto si, Reuters
Nigeria Security and Civil Defence Corp (NSCDC) ekwuola na ha ga-akpọpụ ehi iri anọ na atọ ụlọikpe ma ọ bụrụ na ndị nwe ha apụtaghị.
Afolabi Tolulope bụ ọnụ na-ekwuru ndị Nigeria Security and Civil Defence Corp (NSCDC) n'Ekiti steeti bụ ndị jidere ehi iri anọ na atọ na-emebi ihe ndị mmadụ n'ugbo.
Ndị nwe ya bụ ehi ejidere n'Orin-Ekiti gbara ọsọ kamgbe ahụ
Ndị ọrụ (NSCDC) kpọrọ ehi ndị a kamgbe na-eche ka ndị nwe ha bịa zaa ajụjụ ma bịa kpọrọ ha.
Mana kemgbe ahụ ahụbeghị ha, ebe ndị ọrụ ha nọ na-enye ehi ndị ahụ nri.
Ụgbụa, Tolulope na-ekwu na ike ha ji azụ ya bụ ehi nrị agwụla ha ma sịkwa na ọ bụrụ na ndị nwe ya apụtaghị na ha ga-akpọpụ ehi ndị ahụ ụlọikpe ga nata ụlọikpe ikike ire ha ma were ego ha kpọchie ego ha mefuru ma kwụkwa a ndị ha mebiri ihe ha ụgwọ.
NSCDC kwuru na ha etiela mkpu n'ọha ọkachasị n'aka otu na-achị ehi mana onwebeghị onye pụtara.
Mbata ndị NSCDC na ya bụ okwu gbochiri ndị obodo igbu ya bụ ehi mgbe ha mebiri ihe ha bụ nke ha sị dị oke ọnụ.
A chawala Trump ọkụ ọzọ

Ebe foto si, Reuters
A malitela ịcha ọnyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ọkụ ọzọ dịka okwu ịchụpụ ya n'ọchịchị magoro afọ n'ala.
Ngalaba na-ahụ maka nyocha nzuzo na ụlọomiwu obele nke Ameịka sị ewere kepu kepu na Russia chọrọ inyere Trump aka na ntuliaka ha na-akwado na Nọvemba.
Victor Moses nọ n'egwu

Ebe foto si, Getty Images
Nwa afọ Naịjirịa bụ Victor Moses so n'egwu oge ndị Inter Milan nke mba Italy meriri Ludogorets n'asọmpi Europa League n'abalị Tọzde.
Nke a bụ asọmpi nke isii Moses na-agba kamgbe o si Fernabache gafee Inter n'ọnwa Janụwarị.
Naịjria arịọla ka Amerika maka mmachị amachiri ha

Naịjirịa agwala mba Amerịka ka o kagbuo usoro ọhụrụ mba ahụ wepụtara maka etu ọ ga-esi na-anabata ndị Naijirịa na mba ha.
Ọ bụ Fraide bụ ụbọchị nke 21 n'ọnwa Febụwarị ka atụmatụ a malitere.
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gunyere Naịjirịa n'ime mba ise ndi ọzọ ga-eso n'ime mba ndị ọ chabịri ohere ha ga-eji bata mba Amerịka.
Agbanyeghi na ọtụtụ mmadu na-agbarụ ihe maka atumatụ a, ndi ọru gọọmentị Amerịka si na ọ bụ maka mba ndị a dara atụmatụ eji enyocha ma kesa mpụtara nyocha ndi mmadụ butere mkpachi a fesara Naịjirịa na ndị ọzọ.
Ọ bụ onyeisi Ministri na-ahụ maka obodo bụ Maazị Aregbesola rịọrọ arịrọ n'aha Naijirịa.
Ọ sị: "Naịjirịa dị mkpa dịka ezigbote ọyi Amerịka nke mere okwesighi enwete ụdịrị mgbochi a."
Maka nwaanyị amara Ikpe ọnwụ

Ebe foto si, Uche Akolisa
Nwaanyị amara ikpe ọnwụ n'Abụja maka na ọ gburu di ya amalitela njem ikagbu mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
Maryam Sanda sị na ya bụ ikpe amara ya ezighị ezi maka na-enweghị ezigbo ihe akaebe eji maa ya ya bụ ikpe.
Saụt Korịa na Coronavirus

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, mba Saụt Koria ekeele nkwụcha gbasara ọrịa Coronavirus dịka ọ ji iwe na agirima abata n'obodo ha.
Prime Minster mba ahụ bụ Chung Sye-kyun sị na ya bụ ịkwe n'aka agafewala nkoaka dịka ya bụ ọrịa jidegoro mmadụ dị otu narị iri ise na isii.
Maka Europa League

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu asọmpi Europa League agbaara na Tọzde Wolverhampton Wanderers jị ọkpụ goolu anọ mme Espanyol taa kpuchie ọnụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ meriee Olypiakos.
Club Bruges na Mancheter United ji otu ọkpụ otu ọkpụ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.










