You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2020 Prophecies: Ihe PDP sara Mbaka gbasara amụma 2020
"Mbaka ọ bụ ọkaikpe? Mbaka ọ bụ 'Supreme Court'? Ọ bụ sọ Mbaka bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu?"
Nke a bụ ajụjụ Damian Opara bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' nke Imo steeti na-ajụ.
Opara jụrụ ajụjụ a gbasara amụma afọ ọhụrụ nke Mbaka buru.
N'amụma ahụ, Mbaka kwuru na Hope Uzodimma ga-eweghara ọchịchị n'aka gọvanọ Emeka Ihedioha n'oge adịghị anya.
Mbaka kwuru na ọ bụ Uzodimma bụ olileanya ndị Imo steeti.
Cheta na Uzodimma so wee zọọ ọkwa gọvanọ ime n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mana ọ dara.
O mechara buru okwu ahụ gaa ụlọikpe ma dakwaa ọzọ.
Na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo n'ụbọchị Tọzde, Opara kwuru na amụma ahụ Mbaka buru enweghị isi.
O kwuru sị: "O doro anya na Mbaka bụ onye otu APC."
"Ọ kwụnyere Buhari megide ndị Igbo na ntuliaka niile e merela."
"Mana amụma ya abụghị eziokwu n'ihi na ụlọikpe 'Supreme Court' ekpebiela ikpe ahụ.
Opara kwuru na ndị PDP nakwa ndị Imo steeti niile kwụ Gọvanọ Ihedioha n'azụ.
O kwukwara na amụma Mbaka anaghị echu ha ụra n'ihi na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu.
Amụma Mbaka buru maka afọ 2019
- Mbaka sị na 2020 ga-abụrụ Naịjirịa afọ mgbanwe.
- Ọ sị na a ga-enwe ọtụtụ ihe ịtụnanya n'ọchịchị gọọmenti na Naịjirịa ma n'etiti ma na steeti ga-emetụ onye ọbụla ruo ọkpụkpụ.
- O buru amụma na mgbanwe ga-abịa n'ochichi Imo steeti n'afọ 2020. Ọ sị na Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anya mmiri.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: