Ohanaeze Ndigbo: Ọ bụ oke Ọwụwa-anyanwụ iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ bụ oke ndị Ọwụwa Anyanwụ iwepụta onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023.

Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru nke a ka e wepụtaara ọha akwụkwọ maka ndụ Igwe Nnewi bụ Igwe Kenneth Orizu na Nnewi na nso nso.

Nwodo sị na e meghị etu a bụ igosi ndị Igbo na ha esonghizi n'ihe a na-eme n'ala Naijiria.

Napụnụ nwa onyeisiala akụnaụba ya - Ụlọikpe

Ụlọikpe dị na mba Angola enyela iwu ka a nakọrọ Isabel Dos Santos bụ nwa nwaanyị Jose Eduardo Dos Santos onye bụbụ onyeisiala, ọbaego nakwa akụ ndị ọzọ ọ kpakọrọ.

Isabel bụ onye a na-agụbu dịka 'nwaanyị kacha nwee ego na mpaghara Afrịka', bụ onye a na-ebo ebubo iso ndị kpakọrọ akụnaụba obodo ebe o ruru otu ijeri dọla.

E bokwara ya ebubo ịnwa izubanye nde Yuro iri na mba Rọshịa.

Ebubo a na-abịa dịka onyeisiala mba ahụ bụ Joao Lourenço na-anwa ịnapụta ego ruru otu nde dọla ọ sị na Isabel na ndị otu ji.

Oge ọbụla ka ọ na-agọrọ ụkwụ na aka ya, sị na ọ maghị maka ebubo ndị a na-ebo ya ọkachasị oge nna ya nọ n'ọchịchị.

Ọgụ ọ chara n'Ịran?

Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Ịran esunyela ụlọọrụnnọchiteanya ndị mba Amerịka ọkụ maka iwe ogbunigwe si n'ikuku Amerịka tụpụrụ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha chọrọ ka e mechie ụlọọrụ ahụ.

Rooney ọ ka na-agba bọọlụ?

A na-atụ anya na deede Wayne Rooney dị afọ iri atọ na anọ ugbua, ga-agbara Derby County bọọlụ mgbe ha na Barnsley ga-ezute na Championship.

Cheta na Rooney binyere aka n'akwụkwọ ịgbara ha bọọlụ ma na-etinye ọnụ na nchịkwa kemgbe Ọgọstụ.

Iji 'paracetamol' esi anụ kanda nwere ike igbu mmadụ - NAFDAC

Nke na-ewu ugbua bụ na ụfọdụ ndị n'esi nri ahịa na-etinyezi ọgwụ paracetamọl n'anụ.

Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control' (Nafdac) bụ ndị kwuru nke a.

Ha kwuru na ndị mmadụ na-eme nke a ka anụ kanda ha na-esi ghee ngwa ngwa.

Mana NAFDAC na-adọ aka na ntị ka ndị mmadụ hie asaa n'anya.

Ha kọwara na Paracetamol na-akụrị umeji nakwa ngụngụ mmadụ ma e sie ya n'ọkụ.

Lee ụzọ ị ga-eji sie kanda gị ka o ghee n'oge:

  • Were osiite pụrụ iche a kpọrọ 'pressure cooker' sie ya.
  • Banye ya na 'vinegar' maọbụ na mmanya wine nwa mgbe nta tupu ị malite isi ya.
  • Banye ya na mmiri oroma, ọkwụrụ arọ (paw-paw), akwụ olu (pineapple), ube bekee.
  • Gbatuo ọkụ osiite gi wee sie ya. dgz.

Whatsapp

Site n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba, ụlọọrụ Whatsapp kwuru na ihe karịrị ijeri mmadụ ise agaghịzị enwe obanzikorita ozi 'Whatsapp' n'ekwentị ha.

Atụmaatụ a ga-emetụta ekwenti nwere 'Windows' nke ihe o ji arụ ọrụ nke bekee kpọrọ 'operating system' (OS) karala nka.

Ekwentị ndị a gunyere Nokia Lumia bụ nke kpetere azụ n'iji Windows. Ekwenti a pụtara kamgbe afọ anọ ka na-aga ahịa ruo ugbua.

iPhone na-eji iOS 8 nakwa ekwenti Android nwere sọftware 2.3.7 sokwa na ndị ga-adabanye na mmiri ọkụ a site n'ọnwa Februarị nke 2020.

Kamgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa July, ndị nwere ekwenti "Microsoft store" anaghị ahụ WhatsApp webata n'ekwenti ha.

Ụlọọrụ Whatsapp kwuru na mkpebi a hịara ha ahụ mana nke a bụ ụzọ ha si eme ka ndị mmadụ na ibe ha na-akpakọrịta ọfụma.

Cheta na ha wepụrụ nkwado ha n'ebe ekwenti akpọrọ 'Blackberry' nakwa ekwenti 'Windows'.

Ebelechukwu Obiano o mere alụ?

Nwunye gọvanọ Anambra steeti ọ gara mba Amerịka ime ọgọ hapụ ndị Anambra?

Ọnụ na-ekwuru gọvanọ steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na ọ bụ okpokpo asị.

Kedụ nke bụzị eziokwu?

O kwuru na gọvanọ Willie na nwunye ya bi n'obodo Houston dị na mba Amerịka tupu ọ bụrụ gọvanọ Anambra steeti.

Adinuba kwuru na nkekọrịta ihe enyemaka nwunye gọvanọ mere n'obodo ahụ abụghị ihe ọhụru kama ọ bụ omenaala ha na-emekarị mgbe bi ebe ahụ nke ha agaghị akwụsị.

N'okwu ya, "ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọkata kenye ụmụ ogbenye gbara ha okiri okiri ihe"?

Mana lee ihe otu nọ na soshal midia kwuru maka ya bụ atụmaatụ.

@JohnFanimokun kwuru na nke a pụtara na ndị Anambra nwezuru ihe niile eji ebi ndụ dị mma.

Gịnị ga-eme akwụkwọ ego n̄ọhụụ bụ 'ECO'?

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-eleba anya n'akwụkwọ ego ọhụrụ bụ nke otu ECOWAS kwekọrịtara iji na-atụ mgbere malite n'afọ 2020.

Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru nke a n'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Yusuf Tanko Abdullahi.

Cheta na ọbụ n'ọnwa Jun nke ka mba niile so n'otu ECOWAS nwere nkwekọrịta na ha ga-ejizi otu akwụkwọ ego a kpọrọ 'Eco' wee na-azụkọrịta ahịa.

Ndị gọvanọ achọghị ka ndị agha laa

Ụfọdụ ndị gọvanọ na-arịọ gọọmentị etiti ka ha hapụgodi atụmatụ ịkpọpụ ndịagha na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.

Ndị gọvanọ a na-ekwu na nchekwa adịchabeghi mma dịka ndịagha si ekwu.

Cheta na ndịagha kwuru n'ụbọchị Monde na ha ga-amalite ịdọpụta ndị otu ha n'akụkụ obodo dị iche iche.

Nke a bụ iji mee ka ndị uweojii weghara ọrụ nchekwa ebe ndị ahụ.

Mana gọvanọ steeti Benue, Taraba na Plateau rịọrọ ka gọọmentị ghara ịkpọpụ ndị agha n'ogbe ha.

Samuel Ortom nke Benue Steeti gwara ndị ntaakụkọ Punch na "ọtụtụ ndị steeti m ka nọcha n'ụlọ ize ndụ (IDP Camps)".

"Anyị na-arịọ ka onyeisiala hapụ ndị agha ka ha nọrọ ruo otu afọ ọzọ."

Egwu adịghị maka ụgwọ Naịjirịa ji - Lai Mohammed

Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na egwu adịghị maka ụgwọ gọọmentị Naịjirịa ji ma n'ụlọ ma na mba ofesi.

Mohammed kwuru oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na Legọs.

O kwuru na ụgwọ Naịjirịa ji karịrị ijeri dọla iri asatọ na atọ.

Mana nke ahụ apụtaghị na ọbụ gọọmentị Buhari bitere ego ahụ niile.

Nke ahụ apụtakwaghị na ụgwọ gọọmentị ji na-agbaji ya aka.

Mohammed kwuru na "ego gọọmentị na-ebite ugbua bụ iji rụọ ọrụ mmepe dị icheiche."

Onyeisi 'Nissan' agbaala ọsọ ndụ

Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ ụgbọala Nissan bụ Carlos Ghosn agbaala ọsọ ndụ gbaga mba Lebanon n'ihi ebubo mpụ na nrụrụaka e boro ya.

A nwụchiri Ghosn n'ọnwa Nọvemba afọ 2018 na mba Japan.

Mana onweghị onye ma etu o si mịpụ gbaga Lebanon.

Ghosn ekwuola ugboro ugboro na aka ya dị ọcha n-ebubo ndị ahụ a na-ebo ya.

Ihu eligwe achaala ọbara ọbara na Ọstralia

Puku kwuru puku mmadụ na mba Ọstrelịa na-agbagazi n'akụkụ osimiri ịga zere ndụ n'ihi oke ọkụ ọgbụgba na-achụpụ ha n'ụlọ.

Oke ọkụ ọgbụgba a mere ka ihu eluigwe gbanwee na-acha ọbara ọbara nke mere ka egwu jide ọtụtụ ndị mmadụ.

Ekpomọkụ eruola digrii iri anọ na steeti niile dị n'Ọstrelịa ugbua.

Iheanachọ alọghachila

Nwaafọ Igbo bụ Kelechi Iheanacho ekwuola na obi dị ya mma n'ihi na otu ya bụ Leicester City bụ ndị nke abụọ n'asọmpi English Premier League na-abanye afọ ọhụrụ.

Iheanachọ achọtala ụkwụ bọọlụ ya na ọdị nso dịka ọ na-enyezi goolu aghara aghara mgbe ọbụla etinyere ya n'egwu.

O kwuru na ha na-agbasị mbọ ike ịhụ gara n'ihu na-emeri asọmpi ha.

Football: Onye ga-aga ebee na Jenụwarị

Dịka afọ 2019 na-akụrụ ọnụ, ụzọ emegheela maka nzụta na ire ndị ọgba bọọlụ na mba dị icheiche n'ụwa.

Ụfọdụ ndị a na-ele anya na ha nwere ike ịhapụ otu bọọlụ ha gunyere Paul Pogba nke Manchester United, ǹa Gareth Bale nke Real Madrid.

Ndị ọzọ bụ Olivier Giroud nke Chelsea na Wilfried Zaha nke Crystal Palace.

Akụkọ ndị ga-amasị gị