You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 Top Searches: Naira Marley, RUGA na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019
Ọbịbịa ịntaneetị emeela ka mgbasa na nzikọrịta ozi dịwanye mfe.
Ịchọpụta akụkọ maọbụ onye na-ewu ewu bụzị naanị nkeji olemole ka ọ na-ewe.
Dịka afọ 2019 na-abịa n'isi njedebe, anyị mere nchọpụta gbasara akụkọ, isiokwu nakwa ndị mmadụ a kachasị chọọ n'ịntanetị.
Lee ha ebe a:
Isi akụkọ a kacha chọọ na ịntaneetị
1. RUGA
Dịka mwakpo ndị ọchịehi na-abawanye na Naịjirịa, gọọmentị etiti wepụtara atụmatụ ha kpọrọ 'Rural Grazing Area' (RUGA).
Mana ndị mmadụ anabataghị atụmatụ ahụ chaa chaa.
2. Abụbụ ọrụ ndị ASUU
Abụbụ ọrụ ndị otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naịjirịa abụghịzị ihe ọhụrụ.
Nke ikpeazụ ha gbara bụ n'ọnwa Febrụwarị 2019 ka ha kwụsịrị ya.
N'ọnwa Nọvemba, ASUU jikwa abụbụ ọrụ yijaa gọọmentị n'ihi na ha achọghị iso n'atụmatụ a kpọrọ 'Integrated Payroll Personnel Information System' (IPPIS).
3. Asọmpi iko mba Afrịka
Asọmpi iko mba Afrịka afọ 2019 kporo nnukwu ọkụ.
Ọ bụ na mba Ijipt ka a gbara ya.
BBC Igbo guzoro ka odogwu iwetara ndị Igbo etu ya bụ egwuregwu si gaa.
4. Iko mba ụwa ụmụnwaanyị
Nke dịkwa ka ya bụ iko mbaụwa ụmụnwaanyị a gbara na mba Brazil.
Ọ bụ ụmụnwaanyị mba Amerịka tuuru ugo na ya.
5. Xenophobia
Mwakpo a na-awakpo ndị mbịarambịara na mba Saut Afrịka kawanyere njọ n'afọ 2019.
Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si mba ahụ gbalata n'ihi ya bụ ihe.
Ndị mmadụ a kacha chọọ
1. Naira Marley
Onye oti egwu a wuru ewu maka ihe ọjọọ nakwa nke ọma.
Nke ọjọọ bụ na ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo izu ohi na ịntaneetị.
Ikpe ahụ ka na-aga n'ihu ugbu a n'ụlọikpe dị na Legọs.
Nke ọma bụ na Naira Marley tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ LOL (Lord Of Lamba).
Nwaokorobịa a nwere ọtụtụ ndị ntorobịa egwu ya na-amasị.
2. Atiku Abubakar
Atiku bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, nke so wee zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 mana kụọ afọ n'ala.
Oge e mechara ntụliaka ahụ, Atiku gara ụlọikpe na-ekwu ka e mee ya onyeisiala, mana nke ahụ nyụkwara pịị.
3. Neymar
Neymar bụ onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama.
O wuru ewu na oge ndị mmadụ che na ọ ga-alaghachi otu egwu Barcelona bụ ebe o si pụọ gawa PSG n'afọ 2017.
4. MC Oluomo
Oluomo bụ onyeisi ndịọrụ ụgbọala na steeti Legọs.
Ọbụkwa onye nkwado Bola Tinubu, aka chiburu Legọs Steeti.
Ndị otiegwu
1. Zlatan
Zlatan nwetara nnọọ aka nchawa n'afọ 2019.
Egwu ya dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ.
2. Burna Boy
Ọnwa Burna Boy na-etizi ugbu a.
Nke kacha bụ na ahọpụtara egwu ya maka iso zọọ nrite 'Grammy'.
3. Teni
Nwaada a sozi n'ihe a na-eme ugbua.
Egwu ya na-atọba ndị mmadụ n'ụbụrụ isi.
4. Kizz Daniel
Kizz Daniel tiputara egwu ọhụrụ di icheiche n'afọ a.
Ha gunyere 'Pak n Go', 'Ello Baby' na 'Eko'.
Ndị na-eme ejije a kacha chọọ
1. Regina Daniels
Nwa agbọghọ anaghị agha igosi mma nakwa akụnaụba ya oge ọbụla.
Ihe ọzọ kpatara o ji ewu ewu mgbe niile nwere ike bụrụ maka na di ya bụ onye ọgaranya a ma aha ya.
2. Genevieve Nnaji
Afọ 2019 maara Genevieve Nnaji nnukwu mma.
E wepụtara ihe onyonyoo ya bụ 'Lion Heart' maka ituru ugo 'Oscar'.
Mana o mechara ọ dabaghịzị.
3. Tonto Dike
Aha ọzọ i nwere ike ịkpọ Tonto Dike bụ 'Azụanụụka'.
O wuru ewu n'afọ maka ọtụtụ ihe, otu n'ime ha bụ maka na ọ gara ụlọọgwụ gbanwee ahụ ya nke bekee na-akpọ 'cosmetic surgery'.
4. Hadiza Gabon
Hadiza bụ onye na-eme ihe nkiri n'asụsụ awụsa nakwa bekee.
Mana ebe a kacha mara ya bụ n'ejije nke ndị awụsa.
Ihe nkiri TV a kacha chọọ
1. Big Brother Naija
Nke a bụ ihe nkiri kacha ibe ya e mere na Naịjirịa n'afọ 2019
Onye meriri ya bụ nwa afọ Igbo aha bụ Mercy Eke onye e ji Lamborghini mara abụrụla Ugoeze Big Brother Naija.
2. Mehek
Nke abụ ihe nkiri a na-eme 'Zee World'.
'Zee World' bụ ihe ejije ndị mba India mana ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa.
3. Captain Marvel
Nke a bụ ihe nkiri nke si mba Amerịka.
Ya bụ ihe nkiri wuru ewu oge e wepụtara ya.
4. When they see us
Nke a bụkwa ihe nkiri si 'Hollywood'.
Ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa nke ukwu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ya:
Ihe nkiri ga-amasị gị: