Anambra: Willie Obiano a gaala ikele ọyị ya bụ Ooni Ife

Gọvanọ wiilie Obiano nke Anambra steeti agaala Ife ị kele ọyị ya nwoke bụ Eze ha maka nwunye ọhụrụ ọ nụrụ.

Obiano kwuru na ọbịara ị kele Ooni Ife bụ Arole Oduduwa, Ooni Adeyeye Enitan Ogunwusi, Ojaja II na nwunye ya bụ Olori Silekunola Naomi Ogunwusi(Yeyeluwa) maka ịhụnanya ya na ndị be ya na-egosi ndị

Anambra steeti na Ezinụlọ ya.

Obiano kpere Eze Ife ekpere ma gozikwa ha.

Ooni Ife kelere Obiano onye ọ kọwara dịka ezi enyi kamgbe maka ịhụnanya na nkwanye ugwu o nwere na ebe oche eze Oduduwa nọ nakwa ndị ọchịchị omenaala nọ na Naịjirịa.

Ooni gwara ya na mgbe ha bidochara ọyị ha, ha maghị na Chukwu ga-ebuli ha elu ruo ebe ha nọ ugbua.

Ọ gwara Obiano na obi dị ya utọ etu o si emeta ndị Anambra steeti ọfụma.

Ooni gwara onye ọbụla n'ogige ya ka ha kulie ọtọ kwanyere Obiano ugwu maka ezigbo ọchịchị na agwa ziri ezi Obiano na-egosi kamgbe o bidoro chịwa steeti ahụ.

Ọrịọrọ ya ka ọ ghara ị da mba n'iwulite Anambra steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: