2019 Prophecies for Nigeria: Ihe ndị ụkọchụkwụ kwuru maka etu afọ 2019 ga-esi adị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụkọchukwu na ewu ewu bụ Reverened Father Ejike Mbaka ekwuola na ọchịchị Buhari na-agbalị n'ihe gbasara ịrụ ụzọ nakwa inye ndị ọrụ ugbo ego mgbazinye eji arụ ọrụ.

O kwuru nkea mgbe ọ na-aka ụka iji nabata afọ ọhụrụ 2019 n'Adoration, Umuchigbo Iji Nike Enugwu.

Father kwuru na ya amaghị onye ga emeri na ntuli aka na-ahịa na 2019 ma kwuo na ya echeghị n'Atiku bụ onye nzọpụta Nijiria.

Onyere Buhari ndụmọdụ na ọbụrụ na ọ ga eye ntị chụpụsịa ndị ajọ mmadụ gbara ya gburu gburu na emebiri ya ihe, na gọmenti ya ga adị mma.

Ụfọdụ ụmụ Naijiria akatọọla ndị ụkọchụkwụ burula amụma maka ihe ga-eme n'afọ 2019.

Dịka afọ 2019 malitere ụbọchị Tuzde, ọtụtụ ndị ụkọchukwu a maara aha ha ezipụtala ozi afọ ọhụrụ ha, iji nye ndị mmadụ ntụzi aka gbasara afọ a.

Mana ụfọdụ Ndị Naijiria kwuru na ha na-akụsasị ụmụ mmadụ anya n'ihi n'amụma Okeke buru dị iche na nke Okafor buru.

Ụfọdụ kwuru n'okpu Mbaka kpọrọ ka akwado Buhari bụ mere mere n'ihu gwọmpụtụ n'azụ.

Ihe Mbaka kwuru

N'okwu Chukwu ya na mmemme iji banye afọ ọhụrụ, onyeisi na-elekọta Adoration Ministry Enugu Nigeria, bụ Fada Ejike Mbaka, buru amụma na afọ ọhụrụ a ga-ewetara ọtụtụ ụmụnwaanyị ihu ọchị.

O kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị aga ga-ekuru ejima abụọ na atọ na afọ a.

O kwukwara na afọ a ga-abụ oge mgbanwe tọrọ atọ nye ndụ ndị Naijiria.

Ihe ọzọ gbara elu dịka o siri kwuo bụ na ọtụtụ ndị ogbenye na ndị opekatampe ka aga-eburu ike n'ikikere ọchịchị ụlọọrụ nakwa n'ọchịchị obodo tinye n'aka.

Ihe Oyedepo kwuru:

N'okwu afọ ọhụrụ ya, onyeisi ụlọụka Living Faith Church, nke e jikwa Winners Chapel mara, bụ David Oyedepo, kwuru na afọ a, anyị ga-abụ ọkaibe n'ime ihe niile anyị n'eme.

Enoch Adeboye

Onye a bụ onyeisi ụlọuka Redeemed Christian Church of God, kpara ndị ụlọụka ya ọchị mgbe o kwuru na ọma na ọtụtụ ndị mmadụ n'eche ya ka okwu o okwu gbasara ntụliaka aga eme n'ala anyi na-afọ a.

Ọ gaziri n'ihu gwazie ndị ala anyi ka ha gaa n'ime akwụkwọ nsọ (Abụ akwa 3:22-23) iji mara ihe chineke n'ekwu maka obodo anyị.

Okey Ifionu

Ụkọchukwu na-elekọta Emmanuel Anglican Church, Railway Compound dị na Lagos, kwupụtara na-ewepụtala afọ a dịka mgbe ndị otu Kraisti ga-agbasa oziọma Kraistị na mbaụwa niile iji were rita mkpụrụobi.

Ọ gbadoro ụkwụ mkpebi a n'Akwụkwọ Ilu 11:30.

Paul Chikwem

Ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka Christian Penticostal Mission dị na Festac, Legos kwuru na afọ 2019 bụ afọ Chukwu ga-akwụ ụmụ ya ụgwọ ọrụ nke ukwuu.

Nkpebi a gbadoro ụkwụ na akwụkwọ Genesis (15:1).

Chikwem buru amụma na ụmụ Chukwu ga-enweta ụgwọ ọrụ pụrụiche site n'ịhụọma nke Chukwu na-enye(Abụọma 44:3).

"Aka nchekwa na nweta nke Chukwu ga-enye ụmụ Chukwu ezumike n'afọ 2019"(Exodus 33:14).

Paul Adefarasin

Onye ụkọchukwu a bụ onyeisi ụlọụka a kpọrọ "House on the Rock" kwuru na afọ 2019 ga-abụ afọ aha ụmụ Chineke ga-ada ụda na mba ụwa niile ma nwetakwa ọtụtụ ohere ime ihe ịrịbama n'afọ a.

Ihe Johnson Suleiman

Ahụrụ m Igbo dika onyeisiala n'afọ 2023 mana ha ga-agba mbọ na ha enweghị nkwekọrịta na gọmenti ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị: