Mbaka and Peter Obi: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka arịrịọ Fada Mbaka rịọrọ Peter Obi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Fada Ejike Mbaka bụ onye ụkọchukwu Katọlik rịọrọ Peter Obi ka ọ gbaghara ya n'okwu ọ gwara ya n'izuụka gara aga.

N'ozi nke o kwupụtara n'oge ofufe nro n'ụlọụka "Adoration" dị n'Enugwu, Mbaka sị na okwu ya abụghị ka o mebie aha Obi.

Kama, ọ sị na ọ bụ n'ihi ịhụnanya o nwere n'iwulite ụlọụka Chineke mere o ji kwuo ụdị okwu ahụ.

Mbaka gara n'ihu rịọ ndị niile hụrụ Obi n'anya nke okwu a wutere ka ha gbaghara ya.

Mana arịrịọ Mbaka rịọrọ ebutele ọtụtụ okwu na soshal midia:

Ikechukwu Ezeonyeka n'akara twitter kwuru na ya gbagharala Mbaka ka o mehiela ọzọ.

Nico Gravity sị ka agbaghara Mbaka ma jụọ ihe mere oji kpọta gọvanọ Ganduje nke Kano Steeti n'ụlọụka 'Adoration'.

CJC kwuru na Fada Mbaka kwesịrị ị rịọ ndị Katọlik niile arịrịọ n'ihi na ọ mechuru ha ihu.

Ada Ononenyi sị na Mbaka mere ka ndị mmadụ hụ Obi n'anya karịa maka nkwụwa ọtọ ya.

Akụkọ ga-amasị gị