You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mbaka and Peter Obi: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka arịrịọ Fada Mbaka rịọrọ Peter Obi
Fada Ejike Mbaka bụ onye ụkọchukwu Katọlik rịọrọ Peter Obi ka ọ gbaghara ya n'okwu ọ gwara ya n'izuụka gara aga.
N'ozi nke o kwupụtara n'oge ofufe nro n'ụlọụka "Adoration" dị n'Enugwu, Mbaka sị na okwu ya abụghị ka o mebie aha Obi.
Kama, ọ sị na ọ bụ n'ihi ịhụnanya o nwere n'iwulite ụlọụka Chineke mere o ji kwuo ụdị okwu ahụ.
Mbaka gara n'ihu rịọ ndị niile hụrụ Obi n'anya nke okwu a wutere ka ha gbaghara ya.
Mana arịrịọ Mbaka rịọrọ ebutele ọtụtụ okwu na soshal midia:
Ikechukwu Ezeonyeka n'akara twitter kwuru na ya gbagharala Mbaka ka o mehiela ọzọ.
Nico Gravity sị ka agbaghara Mbaka ma jụọ ihe mere oji kpọta gọvanọ Ganduje nke Kano Steeti n'ụlọụka 'Adoration'.
CJC kwuru na Fada Mbaka kwesịrị ị rịọ ndị Katọlik niile arịrịọ n'ihi na ọ mechuru ha ihu.
Ada Ononenyi sị na Mbaka mere ka ndị mmadụ hụ Obi n'anya karịa maka nkwụwa ọtọ ya.