You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Everton vs Chelsea: Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba
Ndị otu egwu bọọlụ Everton mere ndị nke Chelsea ihe a na-eme nwata ntị ike.
Everton mere ihe a na atụghi anya ya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asatara nani otu merịa ndị otu egwu bọọlụ Chelsea.
Mmeri a na atọ ha ụtọ n'ihi na ha enweghị onye nkụzi dịka ha chụrụ Marco Silva n'ụbọchị 7 Desemba 2019.
Ọ bụ Duncan Ferguson nọchitere dịka onye nkuzi Everton .
Everton kpughere ite goolu ha na nkeji nke ise mgbe Richarlson De Andre ji isi were nye goolu were sị ndị Chelsea nnọọ.
Chelsea gbaliri ike ha ịsa goolu a mana ndị nchekwa goolu Everton jị odeshi.
Na gba nke abụọ ka Dominic Calvert-Lewin mezuru ya abụo dịka eji nkeji anọ banye na gba nke abụọ
Chelsea gosikwara na ọ bụ nwoke na ibe ya na-emekọ ihe mgbe Mateo Kovacic zahachiri ha were nye ndị Chelsea olileanya.
Kama olieanya ha dara mba mgbe Calvert-Lewin mezuru ya atọ were tịpịa olileanya niile ndị Chelsea nwere.
Dịka ichu ndị nkụzi otu egwu boolụ na-ewu na 'Premiership', oge oruola mgbe Lam[ard jị akwara ngwongwo ya?