You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Everton vs Chelsea: E kpunyela Chelsea okpu ogwu taa
Chelsea kwọrọ aka tiere Everton akị na asompi nke Premier League nke mgbede Sọnde a ebe ha jigidere bọọlụ ihe ruru pesenti 67 ma ghara ịgba aka ahịa maọlị n'ọkpụ goolu abụọ Everton nyere ha.
Lee nnọọ ka ndị dị ike sị daa (How are the mighty fallen) 2 Sam 1:19.
Everton bụ otu egwu bọọlụ eji ọnyụpa mara nke mere ha ji nọrọ na ogogo nke 11 n'elu tabulu Premier League ahụ.
Mana ha gbara mbọ ịkputu Chelsea n'ala site n'iwe ọkpụ goolu abụọ wụkpọọ ha anya..
Onye egwu ndị Everton bụ Richarlison ji isi tinye goolu mbụ ha n'aka eru nwata Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu ndị Chelsea mgbe ọ kụrụ nkeji 49.
Arrizabalaga kwuru na ya abụghị nkata mgbe oji nwaanyọ butuo penariti Gylfi Sigurdsson bụ onye gosiri ya nkarị na nkeji 72 mgbe o nyere goolu nke abụọ bụ nke o ji gbaara Chelsea ụgbọ nwamkpi.
Mmeri a dọghachiri Chelsea azụ tinye ha na ndị nke isii na tebulu Premier League.
Eden Hazard kpọkwara ganịganị ịgbara isi onwe ya mana Jordan Pickford nke Everton gwara ya na nkiti ga-azụ n'ahịa udele taa.
Otu a ka Chelsea sị gbara aka nkiti laa taa.