Chelsea Vs Man United: E ji Chelsea gbụchachaa ọnụ gbụfuo

Manchester United ji obi ndị Chelsea sie "maị maị" dịka ha gbawara ha aka napụ ha ohere ịzọ Iko Carabao.

Goolu atọ e nyere n'ọgbọegwuregwu Stamford Bridge" ezughị ịkwụsị mmadụ ịpụ n'asọmpi a.

Ndị Man Utd bu ụzọ chịrị ọkụ bịa na nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mgbe Marcus Rashford ji penariti dọkaa neetị.

Mana Michy Batshuayi bịara saa ya na nkeji 61, nyetụ ndị Chelsea obere olileanya.

Na nkeji 73, Rashford gosiri ihe e ji akwụ ya ụgwọ ọnwa, ka o ji mbada "free kick" tụkwasị goolu nke kpọnyere ntu n'akpati Chelsea.

Goolu a mere ya goolu ise Rashford na-enye Chelsea kemgbe o jiri gbawara Man Utd bọọlụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: