You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu Kidnapping: A tọhapụla Fada Arinze Madu a tọrọ n'Enugwu
A tọhapụla Fada Arinze Madu nke ụlọakwụkwọ Queen of Apostles Seminary School, Imezi-Owa n'Okpuru Ọchịchị, Enugwu steeti.
Ndị ntọ tọrọ Fada Arinze Madu na mgbede ụbọchị Mọnde 28 Ọktoba, 2019 n'ọnụzọ ama ụlọakwụkwọ ahụ dịka ọ kwọ ụgbọala ya apụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ ,Ebere Amaraizu kwuru na ọ bụ ezie na ahapụla Fada Madu mana o kwughị ma a kwụụ ụgwọ iji gbapụta isi ya.
BBC Igbo gbara mbọ inweta echiche ndị ụka Katọlik n'Enugwu mana e nwetabeghị ha ugbua anyị na-ewetara gị akụkọ a.
Fada Madu so n'ime ndị ụkọchukwu na-elekọta ụlọakwụkwọ semịnarị a anya. Fada bụ onye e chiri ụkọchukwu n'afọ 2017 bụbu ụkọchukwu nke St. Michaels Katọlik dị n'Ugwuaji tupu ọ gaa n'ụlọakwụkwọ seminari a bụ ebe a tọrọ ya.
Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu gwaburu BBC na ndị uweojii na-agba mbọ ịchọpụta ma tọhapụ Fada a.
Amarizu kwuru na ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Madu ma ọ bụ sị ha kwụọ ụgwọ ego ọbụla n'isi ya iji gbapụta.
Ọnụ na-ekwuru ndị ụka Katọlik n'Enugwu bụ Fada Benjamin Achi tuburu arrịrị sị na ọ bụ ihe mwute ma kwuo na ụka Katọlik Enugwu nke Bishop Onaga nọ n'isi ya adịbeghị njikere ikwu ihe ọbụla banyere ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: