You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Muhammadu Buhari: O mekarịala njem kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa May?
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-esi mba Saudi Arebia ebe ọ gara maka nzukọ gbasara ọdịniihu achụmnta ego zọpụ ije garuo London ebe ọ ga-anọ njem ezumiike site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri na asaa.
Njem a kpalitere okwu nke mere ka ụmụ Naijirịa jụwa maka ụgboro ole ọ nọrọla na mba ọzo na-abụghi Naijirịa.
BBC mere nchịkọta ugboro ole na ole onyeisiala garala njem n'ofesi kamgbe ọ ṅụrụ iyiọrụ n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee 2019.
Ebe ndị ọ gara na abalị ole ọ nọrọ
Saudi Arebia
Ọ gara Saudi Arebia ka chi ụbọchị e duru ya iyi ọrụ fochara, nke bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee.
Niger
Onyeisiala Muhammadu Buhari gara mba Nijee maka nzụko "African Union".
Ọ hapụrụ Naijirịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị ma lọta n'ụbọchị asatọ.
Ọ nọrọ otu abalị - Otu (1)
Japan
Onyeisiala Buhari gara mba Japan maka nzukọ ịkwalite akụnaụba mba ndị dị n'Afrịka.
Ọ hapụrụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọstụ.
Buhari lọtara n'ụbọchị iri atọ na otu nke Ọgọstụ.
Ọ nọrọ abalị - Asaa (7)
Burkina Faso
Buhari hapụrụ Naịjiria gawa mba Bọkịna Faso n'ụbọchị iri na atọ nke Sepụtemba ma lọta n'ụbọchị iri na ise.
Ọ nọrọ abalị - Atọ (3)
New York
Buhari hapụrụ Naịjirịa gawa mba Amerịka n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Sepụtemba maka nzụkọ 'United Nations General Assembly' (UNGA) na New York
Ọ lọtara n'ụbọchi iri abụọ na asatọ.
Ọ nọro abalị - Asaa (7)
Saụt Afrịka
Njem Buhari mere na mba Saụt Afrịka bidoro n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba ma lọta n'ụbọchị anọ nke Ọktoba.
Buhari lọtara n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọktoba.
Ọ nọrọ abalị - Atọ (3)
Rọshịa
Buhari gakwara mba Rọshịa n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba.
Ọ lọtara n'ụbọchị iri abụọ na ise.
Ọ nọrọ abalị - Ise (5)
Abalị ole ka Onyeisiala Buhari nọrọla n'ofesi
Onyeisiala Buhari anọola ihe ruru ụbọchị iri abụo na otu, nke pụtara izuụka atọ kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa Mee 2019.