You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Xenophobia in South Africa: Buhari ga-amata ọnọdụ ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka
Akụkọ dị mkpa:
Buahri ga-awụchi Saụt Afrịka echi
Onyeisiala Buhari ga-ahapụ Naịjirịa gawa mba Saụt Afrịka echi izute onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa bụ ebe ọ ga-anọ abalị atọ.
Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu sị na njem a bụ maka mkparịtaụka ọdị mma ndị Naịjirịa bi na mba ahụ.
Cheta na onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyrila Ramaphosa kpọrọ onyeisiala Buhari oku a maka iji hazie mmekọrịta dị mma n'etiti mba abụọ a.
Njem a na-abịa n'ime izuụka ole na ole mwakpo 'xenophobia' mere na mba Saụt Afrịka ebe e bulatara ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na mba ahụ.
Onyeisiala Buhari na ụmụafọ Naịjirịa na mba Saụt Afrịka ga-enwe mkparịta ụka dịka Garba Shehu si kwuo.
Ihe Peter Obi kwuru maka Naịjirịa
Dịka Naịjirịa mere emume ncheta ụbọchị nnwere onwe ya taa, ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu banyere ọnọdụ ya.
Peter Obi chịburu Anambra Steeti sị na nchekwa, mbite ego, na e nweghi ọrụ so na nsogbu ndị chere Naịjirịa n'ihu.
N'ofesi
Ndị uweojii agbala otu onye n'ime ndị na-eme ngagharịiwe megide gọọmentị Chaịna na Họng Kọng egbe n'obi ya
Nke a bụ mbụ a na-agba mmadụ ezigbo mgbọ egbe n'ime ngagharịiwe a chụwarala izuụka anọ.
N'egwuregwu
Asọmpi Uefa Champions League nke izuụka abụọ ga-ebiri ọkụ n'abalị a ebe otu egwu ndị dịka PSG, Bayern Munich ga-apụta ihe.
Ndị ọzọ gụnyere Juventus, Man City, Bayer Leverkusen, Tottenham na Atletico Madrid.
Nkeji