Natural Resources: Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Imo steeti so na steeti na-emepụta mmanụ agbịdị na Naịjirịa.

Ụmị mmanụ agbịdị dị n'Imo steeti karịrị otu narị na iri isii.

Ụmị ndị dị n'obodo iri na abụọ na steeti ahụ

Mana ọ bụghị naanị mmanụ agbidi bụ ihe akụ ọnatarachi dị na steeti ahụ.

Lee ndị ọzọ ebe a dịka nchọpụta ngalaba 'Raw Materials Research & Development Council' si kwuo.

1) Zinc

Zinc bụ ụdị igwe e si n'ala egwupụta.

Chaịna, Peru nakwa Ọstrelia bụ mba ndị e ji mmepụta 'zinc' mara.

Ọ na-enye aka na mmepụta ọkụ latrik.

A gwakọọ 'zinc' na 'copper', e nweta 'brass'.

E nwekwara 'zinc' nke na-edozi ahụ.

Ihe ndị ọọ e ji 'zinc' emepụta bụ rọba, mmanụ e ji ete ụlọ (paint), na kemịkalụ ụfọdụ.

Na mpaghara ụfọdụ n'Okigwe na Orlu ka e nwere 'zinc' n'uju.

2) Gypsum

Gypsum bụ ụdị nkume e si n'ala egwupụta.

Ihe e ji ya arụpụta gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP).

E jikwa ya eme ka ala kawanye mma iji kọọ ihe.

Ebe ị ga-ahụ 'Gypsum' bụ n'Okigwe.

3) Lead

Otu ihe kacha mkpa e ji 'lead' emepụta bụ 'battery'.

'Battery' bụ ihe na-enye ụgbọala, ọgbatumtum, ekwentị na ihe ndị ọzọ ike.

E jikwa lead emepụta igwe na ihe ndị ọzọ.

Okigwe na Orlu nwere 'lead' n'uju.

4) Limestone

Ihe e ji 'limestone' arụpụta buru ibu.

Ha gụnyere 'cement', 'ceramics' na ihe ndị ọzọ.

'Limestone' na-aka mfe igwupụta karịa nkume ndị ọzọ. Ebe e nwere ya n'Imo Steeti bụ na mpaghara Ohaji-Egbema na Okigwe.

5) Kaolin

'Kaolin' bụ ụdị nkume ọcha na-akwọ mụrụmụụ.

E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics', werekwa ya arụ ọgwụ na-akwụsị otoro maọbụ afọ ọsịsa.

Kaolin dị n'Ehime Mbanọ, Isu nakwa Oru North.

6) Lignite

Lignite bụ ụdị 'coal'.

Mana ọnaghị eji uji nke ukwu dịka 'coal' ndị ọzọ.

A naghị ejikarị 'lignite' akwọ ụgbọ oloko (train).

Ebe ọ na-aka egbo mkpa bụ na mmepụta ọkụ latrik.

'Lignite' dị n'akụkụ ụfọdụ n'Orlu'.

7) Bentonite Clay

Na mpaghara Ideato South nakwa Isu ka e nwere 'bentonite'.

Nke a bụ ụdị aja ụrọ na acha ọcha.

Ọ na-enye aka n'igwu ụmị dị icheiche dịka ụmị mmiri nke Bkee kpọrọ 'Borehole'.

Ọrụ ya bụ igbochi mmiri ịba ebe achọghị ka ọ baa.

8) Ndị ọzọ

Obodo dị icheiche n'Imo Steeti nwere ọtụtụ emume ọdịnala mara mma nke ukwu.

Ọ bụrụ na e lebaa emume ndị anya ma mezie ya nke ọma, ọ ga-adọta ndị mmadụ ka ha na-abịa njem nlereanya na steeti ahụ.

Bịa tinyekwara oshimiri Ugwuta nke a na-akpọ 'Oguta Lake' na Bekee.

Ụdị ihe a bụ ihe na-amasị ndị njem nke ukwu.

Imo bụkwa steeti ala ya na-emepụta nri nke ọma.

Naanị nkọpụta nri, ma e mezie ya ọfụma, nwere ike inye gọọmentị Imo nnukwu ego.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: