Onyeka Onwenu, Genevieve Nnaji, Linda Ikeji na ụmụada Imo state ndị ọzọ obodo Nigeria jiri biri

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ọ bụghị asị na ọtụtụ ụmụnwaanyị Imo steeti emetela ihe a ga-eji were ha na-etu ọnụ na Naịjirịa nakwa n'ụwa gbaa gburugburu.

Ụmụnwaanyị ndị a egosila ihe mere ha "dike" n'ọgbọ e ji mara ha.

Ọ bụ n'egwuregwu, ndọrọndọrọ ọchịchị, ime ejije, ka ọ bụ n'agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ? Ha bụ anụ a na-agba egbe ọ na-ata ahịhịa.

Lee ụmụnwanyị ndị BBC Igbo chọpụtara bụ ọkaibe n'Imo State:

Onyeka Onwenu

Onwenu bụ "olu ogene" nakwa agbara nwaanyị ma a bịa n'ihe gbasara ịgụ egwu.

Dimkpa nwaanyị a bụ otiegwu, ọ rụburu dịka onye ntaakụkọ na BBC/NTA, ọ na-emekwa ejije na Nollywood kwa mgbe.

O nwetala nturuugo dị icheiche maka ime ejije nakwa egwu ya.

Kemafo Chikwe

Chikwe rụburu dịka mịnịsta na-ahụ maka njem site n'afọ 1999 ruo 2001, nakwa nke na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2001 ruo 2003.

Ọ rụkwara dịka onye ntaakụkọ nakwa onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Aịalandị.

Ọ bụ odeakwụkwọ nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba.

A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 1951.

Chris Anyanwu

Anyanwụ bụ onye ntaakụkọ nwere ụlọ mgbasaozi nke ya.

Ọ rụkwaala dịka sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa, ọ bụkwa odeakwụkwọ.

Ihe o detara n'akwụkwọ mgbasaozi mere ka a tụọ ya nga mkpụrụ ọka site n'afọ 1995 ruo 1998, ma mee ka e nye ya nturuugo maka obiisiike ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba, 1951.

Chinwe Norah Obaji

Obaji arụọla dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

Ụmụakwụkwọ na-achọ ibanye mahadum na Naịjirịa kwesịrị ịma ya makana ọ bụ ya tinyere iwu e ji malite ile ule ndị mahadum a kpọrọ "Post UME".

Eucharia Anunobi

Anunobi bụ ome ejije a ma ama maka ime ejije ka ọ dịka ihe na-eme ezie.

O meela ejije karịrị narị kemgbe o ji malite.

A mụrụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, 1965.

Genevieve Nnaji

A kọwa akụkọ maka ejije na Naịjirịa ma a kpọbeghị aha nwaanyị a Imo steeti ji eme ọnụ, aha e bidokwalanụ?

Nnaji emeela ejije karịrị narị, ma nweta ihe nrite nakwa nturuugo karịrị iri.

Ọ na-emepụtazị ejije nke ya ugbua, o mepụtara nke ndị ọnụ na-eru n'okwu na Hollywood zụụrụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 1979.

Rita Dominic Nwaturuocha

Dominic bụkwa otu onye a na-asị "ụnụ abịala" n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood.

O meela ọtụtụ ejije karịrị narị, ma rite nturuugo karịrị iri.

A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Julaị, 1975.

Linda Ikeji

Ikeji bụ otu onye a na-akpụkarị n'ọnụ na Naịjiria ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ide ihe n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ "Blogging".

Ọ nwere ụlọmgbasaozi nke ya, ọ bụkwa onye ọmepụrụ onye n'ihe gbasara ilekọta ụmụagbọghọ.

O nwetala nturuugo ma na Naịjirịa ma na mba ofesi.

A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba, 1980.

Perpetua Nkwocha

E nwereike ichefu nwaanyị a n'ụwa egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa n'ụwa a?

Ihe Nkwocha ji ụkwụ gbaa n'ụwa a, "2 ekenwughi ya".

O so Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mba Afrịka asaa, ma mabute iko ise n'ime ha.

O nwetara nturuugo "Nwaanyị kacha agba bọọlụ n'Afrịka" ugboro anọ n'aka ndị Confederation of African Football (CAF).

A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị 1976.

Desire Oparanozie

Oparanozie bụ akwaa a kwụrụ n'ihe e ji ụkwụ eme n'ọgbọegwuregwu.

Ọ gbaala bọolụ n'ọtụtụ otu egwuregwu na mba ofesi kemgbe ọ malitere iji ịgba bọọlụ akpa ego.

O sorola Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mbaụwa atọ, nakwa Iko Mba Afrịka anọ ebe o buliri iko anọ ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Disemba, 1993.

Stephanie Okereke-Linus

Okereke-Linus sokwa na ndị nwere agba na Nollywood.

Ọ na-eme ejije, na-ede ejije, na-emepụtakwa nke mbiputa.

O nwetala ọtụtụ nturuugo site n'ime ejije, ọ bụkwa "Member of the Order of the Federal Republic, MFR".

A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 1982.

Chioma Ajunwa

Ihe Ajunwa mere n'egwuregwu Naịjirịa so n'ihe ndị mmadụ ga-akpụgide n'ọnụ n'ụwatụụwa.

O ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo mbụ ya n'Olimpiks n'afọ 1996.

O nwere nturuugo "Member of the Order of Niger - MON"

A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba, 1970.

Betty Anyanwu-Akeredolu

Ọ bụ onye na-akụ azụ na ụmụanụmanụ mmiri ndị ọzọ, ọ bụkwa omepụrụ onye.

Makana ọ rịara ọrịa akpụ nke ara mana ọ taghị isi ya, o buzi ibuso ọrịa ahụ agha n'isi.

A mụrụ ya n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, 1953.

Munachi Abii

Abii bụ ezigbote "nwata makata mma" nke gosiri oge o meriri n'asọmpi "nwaanyị kacha maa mma" n'afọ 2007.

Ọ na-ede egwu, na-agụkwa agụ. Ọ bụkwa ihe Bekee kpọrọ "model".

A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba, 1987.

Chidinma Ekile

A gụwa ụmụnwaanyị na-agụ egwu nwereike ime ka ị nyechaa ha ego i nwere n'ụlọakụ na Naịjirịa, Chidinma so n'ime ha.

O nwetala ihe nrite ma gakwaa ọtụtụ mba dị iche iche site n'ịgụ egwu.

A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee, 1991.

Sandra Achums

Achums so n'ụmụnwaanyị "na-apụ ọkụ" oge ọ na-eme ejije na Nollywood mgbe ndị dịka Dolly Unachukwu, Eucharia Anunobi na ndị ọzọ bụ ndị a na-achọ ka akara ọkụ.

O mere ejije ruru 20 mgbe ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba, 1967.

Lauritta Onye

O riterela onwe ya na Naịjirịa ọlaedo abụọ site n'ịtụ "shotput".

Ọ bụkwa onye na-eme ejije na Nollywood.

A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1984.

Christy Opara-Thompson

Opara na-awụ awụ, na-agba ọsọ.

Ọ gbatara otu ọledo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara n'ọsọ, ebe ọ wụtara otu ọlanchara oge ọ bụ ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke Mee, 1970.

Flora Nwapa

E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Nwapa? Ọ dị egwu!

Nwapa bụ 'a takata a gbọo' n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ.

Ọ rụkwara dịka onye nkuzi, minista na-ahụ maka ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ, ma mechaa rụọ ka minista na-ahụ maka ala na mmepụta obodo.

A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931, mana ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993.

Priscilla Nzimiro

N'agbanyeghị na ọ nwụrụ naanị ka otu afọ o ji gụchaa akwụkwọ o ji bụrụ dọkịta ahụike gachara, a ka na-echeta ya site n'ụlọakwụkwọ abụọ e hibere maka ya n'obodo ya bụ Ugwuta.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ji maka ya banye ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dọkịta ahụike.

A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Epreelụ 1923, ọ nwụọ ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, 1950.

Ụmụnwanyị ndị ọzọ Imo steeti ji aba mba gụnyere Viola Onwuliri bụbu mịnịsta maka agụmakwụkwọ, Daniella Okeke na-eme ejije na Nollywood, Catherine Acholonu bụ odeakwụkwọ a na-anụ aha ya oge ọ dị ndụ, Lesley Obiora Amede bụ ọkaiwu na mba Amerịka, na ndị ọzọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: