Victor Ezugwu: Onye bụ dike a rụpụtara ụgbọagha MRAP mbụ na Naịjirịa?

Dike Igbo aha ya bụ Victor Okwudili Ezugwu edebaala aha ya n'akwụkwọ akụkọ Naịjirịa ruo ụwatụwa.

Ezugwu bụ onye ọchịagha n'otu ndị agha Naịjirịa.

Ọ kpaala ike di egwu tụmadị n'ọgụ Naịjirịa na-aluso ndị otu oyiegwu Boko Haram.

Mana n'ọdị nso a ka o mere ihe nyịrị dike di icheche omume.

Ezugwu rụpụtara ụgbọala e ji aga ọgụ bụ nke a kpọrọ Ezeugwu MRAP (Mine-Resistant Ambush Protected).

Ụgbọala a bụ anwụ anwụ maka na mgbọ egbe maọbụ ogbunigwe agaghị emebinwu ya.

Nke a bụ nke mbụ a na-arụpụta ya bụ ụgbọala na Naịjirịa.

N'ụbọchị Wenezdee ka onyeisiala Muhammadu Buhari meghere ya bụ ụgbọala n'ogige ebe ndị agha na-arụpụta ihe nke dị na Kaduna.

Mana onye bu Ọchịagha Victor Ezeugwu?

Victor Okwudili Ezugwu bụ onyeisi ụlọọrụ 'Defence Industries Corporation of Nigeria" (DICON).

A mụrụ ya n'afọ 1964 n'ọnwa Jun ebe ọ banyere Nigeria Defence Academy n'afọ 1985.

Lee ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka ya:

  • Ọ gụrụ 'History' na 'Nigerian Defence Acedemy' dị na Kaduna, mechaa ga gụkwa 'Strategic Studies' na Mahadum Ibadan
  • O ji asambodo ọkankụzị nke Bekee kpọrọ Ph.D
  • Ọ gakwara ọtụtụ ọzụzụ ndị ọzọ na Naịjriịa ma n'ala Bekee
  • Ọ bụbu onyeisi 28 'Task Force Brigade' nakwa osote onyeisi '7 Division'
  • Ugbua Ezeugwu bụ onyeisi Nigerian Army Vehicle Manufacturing Company (NAVMC) nke dị na Kaduna

Ndị a bụ nzere ndị o ji:

  • FSS MSS DSS psc Golden Jubilee Medal CM Fd Comd Medal of honour
  • General Operations Medal ECOMOG in Liberia (NIBATT 11)
  • Op TIGER TAIL/ SAND STORM in Sierra Leone (NIBATT 33)
  • UNAMSIL na Op ZAMAN LAFIYA DOLE na ndị ọzọ.

N'aka ọzọ, ọ nwere mgbe o wuru na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Emmanuel Ezugwu rụrụ MRAP ahụ.

Mana ndịagha Naịjirịa pụtara kọwa ya nke ọma.

Akụkọ ga-amasị gị