Mama Boko Haram: EFCC akpụpụla Aisha Wakil ụlọikpe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

EFCC na-ebo Aisha Wakil ebubo mpụ ego ruru nde naịra iri isii na isii n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde na Borno steeti.

Onye ọzọ a na-atụ aka na o so kpaa mkpa mkpa a bụ Tahiru Saidu Daura.

Okwu ha bidoro mgbe otu nwoke a kpọrọ Ali Tijjani kwuru na ha gwara ya bunye ha nrị ọka akpọrọ 'Biski' ha jụrụ ịkwụ ya.

Ụlọikpe nyere ha ohere ịgbapụta onwe ha n'ọnụ nde naịra iri atọ ma sị ha bịaghachi n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020.

Gaasị agbaala na Legọs

Mmadụ atọ merụrụ nnukwu ahụ oge udu gaasị gbara n'ike n'ogige ụlọoriri na nkwari dị na Victoria Island na Legọs.

Aha ya bụ ụlọ oriri na nkwari bụ Four Point by Sheraton.

Dịka ndị 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA) si kwuo, ndị ọrụ ji gas agbado ihe ọkụ mgbe ya bụ ihe mere.

Eburula ndị ahụ merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị na Lagos Island.

Jose Mourinho ọ ga-ahụ nke tọrọ fada n'Old Trafford taa?

Jose Mourinho ga-ahụ ma ọ ka bụ anụ kpọrọ nkụ na-eju ọnụ mgbe Tottenham na Manchester United ga-ezute taa.

Asọmpi a ga-esu n'ọgbọegwuregwu Old Trafford bụ ebe Mourinho chịkọtara Man Utd afọ abụọ na ụma.

Mourinho emeriela egwuregwu atọ Tottenham gbarala kemgbe o werela ọchịchị n'ụbọchị Nọvemba 20, 2019.

Ebe ụkwụ na-ama Solskjaer na onwe ya riririri ka o nwetara onye lawa onye lawa abụọ, e merie ya n'otu n'ime egwuregwu atọ ọ gbarala nso nso a.

N'asọmpi ndị ọzọ a ga-enwe n'abalị Wenezdee, Liverpool ga-ezute Everton.

Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ asọmpi a ka a ga-eji mara ma onye nkuzi ndị Everton bụ Marco Silva ọ ga-anọ n'ọrụ ka ọ ga-akwara laa.

Chelsea ga-ezute Aston Villa, Leicester ga-ezute Watford ebe Wolves ga-ezute West Ham.

Gbọọnụ ụgwọ unu riri

Ụlọikpe etiti enyela otu a kpọrọ SERAP iwu sị ka ndị niile bụ sinetọ na mịnịsta chịburu dịka gọvanọ mana ka na-eri ụgwọ ezumiike nka, gbọọ nke ha riburu.

Ya bụ iwu nyekwara onye ji akpaego Naịjirịa ikike ịgba ha akwụkwọ ka ha kwuo ebe ha si enweta ikike ha ji eri ya bụ ụgwọ.

Germany achụọla ndị nnọchite anya Russia na be ha

Mba Germany achụọla mmadụ abụọ na-anọchite anya mba Rọshịa n'obodo ha.

Nke a bụ maka ebubo ha na-ebo na Rọshịa ma maka mgbagbu a gbagburu otu nwoke onye Chechen na Berlin n'ọnwa Ọgọst afọ a.

Chechen bụ obodo si na Rọshịa wee nwere onwe ha n'afo 1993.

Nweta TIN gị tupu ị were ego n'ụlọakụ - Ahmed

Minista na-ahụ maka akụnaụba obodo bụ Zainab Ahmed, ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịdọrọ ego ya n'ụlọakụ na-enweghi ihe Bekee kpọrọ Tax Identification Number site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020, jiri nwayọ dụọ azụ.

Mmiri eburula onye gara ịzọ mmadụ

Ihe mgbawa obi mere ebe nwaagbọghọ chọrọ ịzọpụta otu nwoke ka idemmiri na-achọ iburu ya na mba Kenya, tụnyere ndụ ya.

Nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Ann Nduku dị naanị afọ iri na itoolu, dabara n'iyi Kandisi dị n'obodo Ongata Rongai, dị nso isiobodo Nairobi, n'ụbọchị Tuusde, ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba.

Nwoke ọ gara ịzọ anwụghị, mana mmiri buru Nduku eleghi anya n'azụ.

Nne ya bụ Elizabeth Mutuku, nọ ebe ahụ ma hụ ka mmiri na-ebu nwa ya, kwuru na mbọ ọ gbara inyere ya aka lara n'iyi.

A gbaala ndị 'oji mgbọ' na WAEC ama

Ọ bụrụ na ị sọ na ndị 'ji mgbọ' lee ule ' West African Examinations Council' WAEC 1992/1993, asambodo gị efuola ọhịa o.

Ụlọọrụ Jamb depụtara aha ndị ha sị gbara ya bụ mgbọ n'afọ ahụ, ma kwuo na ọ bụ mmerụaka a mere ha ji sie ọnwụ ka ndị niile ga-agbata akwụkwọ ule ahụ site n'afọ a, jiri akara njirimara ndị nwaamala Naịjriịa.

Ihe gọọmentị Naịjirịa nwere ikwu maka mwakpo ndị Naịjiria na Ghana

Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche ngalaba na-anọchite anya ndị Naịjirịa bi n'ofesi akatọọla mwakpo a malitere iwakpo ndị Naịjirịa bi na Ghana.

Abike gara n'ihu rịọ ndị Naịjirịa ọkachasị ndị a gbachiri ụlọahịa ha ma sị na iwe ewela ha, ma rịọ ndị ọrụ nchekwa mba ahụ ka ha gbaa mbọ chekwaa ndị mmadụ na ngwongwo ha.

N'ofesi,

Ndị ụlọomeiwu mba Amerịka emeela iwu imegide ihe ha kpọrọ nwụchi na mmegbu ndị ekpere Alakụba Uighur, na mba Chaịna.

Ka ọ dị ugbua, Gọọmentị Chaịna ekwuola na ọ bụ obi ọjọọ mere Amerịka ji ekwutọ ha n'ụdị a.

N'egwuregwu,

Man City ji iwe were goolu anọ a satara naanị otu gbajuo Burnley afọ ka ha zutere na Premier League n'abalị Tuusde.

Cheta na ha na Newcastle gbara onye lawa onye lawa n'izu gara aga.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: