Accident victim help: Etu ị ga-esi nyere mmadụ aka ghara igbu onwe gị

Ọkụ latrịk

Ebe foto si, Getty Images

Onye ọkwọ ọgbatumtum anwụọla ebe ọ na-azọpụta nwoke kụrụ ụgbọala ya na poolu ọkụ latrịk.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Lagos steeti bụ Elkana Bala kwuru na ọkụ latrịk dọgburu onye ọkwọ ọgbatumtum ahụ aha ya bụ Abdullahi Hassan ebe ọ gara ịzọpụta nwoke ahụ nwere ọdachị a.

N'okwu Elkana, "Ọkụ latrịk dọgburu Hassan mgbe ọ zọrọ ụkwụ n'elu eriri ọkụ latrịk ahụ ụgbọala kuturu poolu ya."

Ihe mberede

Ebe foto si, Getty Images

Onye na-azọpụta mmadụ na-ebuzo azọpụta onwe ya.

Lee ihe ole na ole i kwesiri ịma tupu ịgbara gawa ịzọpụta onye ihe mberede ọbụla dakwasiri dịka onye ọkammụta n'ihe gbasara nchekwa si kwuputa.

  • Jụọ onwe gị ma ibu ọkammụta n'ihe gbasara ihe mberede ahụ dakwasara onye ahụ.
  • Ị bụrụgodi ọkammụta, yiri uwe nchekwa ga-eme ka ịgbanahụ imerụ ahụ n'ọdachi.
  • Ọ bụrụ na ọ bụ ọdachị gnke ọkụ latrịk, ọ ga-adị mma ka ị kpọ ndị ọrụ ọkụ latrịk
  • Ọ bụrụ ụgbọala na-agba ọkụ ,kpokuo ndị mmadụ ka ha nyere aka gbanyụọ ya
  • Che echiche maọbụ ezigbo ọdachị ka ọ bụ nke e mere dịka 'arrangee'
  • Yiri uwe aka ga-egbochị gị imetụ ọbara makana ị maghị ọrịa onye ị na-enyere aka bu.
  • Ọ bụrụ na ịhụ ebe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ na-azọpụta onye ahụ, kwụrụtụ gee ntị ka ị mata asụsụ ha na-asụ.

Akụkọ ndị ga-masị gị